Shiites: Kedu ebe ndị uweojii kpọchịrị mmadụ 400 ha nwụchịri?

Ndị ụka shiites na-eme ngagharịwe Image copyright Getty Images

N'ime akwụkwọ ozi nke Jimoh Moshood bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii binyere aka na ya, anwụchiela mmadụ 400.

O kwukwara na anwụchiri ha n'ihi nsogbu ha na-enye ọha mmadụ nakwa ngwa ọkụ ha gbara ụgbọala ndị uweojii.

"Ndị uweojii agaghị agba nkịtị ka ụfọdụ ndị mmadụ jiri iwu ala mee akaja" bụ ihe ọzọ pụtara n'ime akwụkwọ ozi ahụ.

Ọzọ bụ na "onyeisi ndịuweojii akatọọla atụmatụ ndị ahụ" ma jiri ohere a na-agwa steeti ndị gbara Abuja gburugburu ha kee nkwụcha.

Onyeisi ụlọomeiwu bụ Bukola Saraki katọọ ihe ọ kpọrọ mmefu ndụ ndị mmadụ site n'akara Twitter ya

N'azụ ọgbaghara dara n'etiti ndị agha Naịjirịa na ndị ofufe alakọba akpọrọ Shia ụnyaahụ, ndị mmadụ gbara ọsọ ụkwụ erughi ala n'ehihie taa.

Ụda egbe bidoro dawa na gburugburu Wuse 2, bụ obodo dị n'ime Abuja.

Ihe nkiri ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri ka ụda egbe na-arị ibe ya elu n'ebe asị bụ Wuse ahụ.

Otu n'ime ihe nkiri a gosiri ndị dịka ha abu ndị Shia na-eme ngagharịiwe maka onyeisi ha bụ Ibrahim Elzakzaky aka ji kemgbe afọ abụọ, agbanyeghi na ụlọ ikpe sị ka atụhapụ ya.

Onye tinyere ihe nkiri a bụ onye nwe akara Twitter @Clinton_Vice_B. Nyere ndị mmadu ndụmọdụ ka ha hapu ịga Wuse 2.

Amara Nwankpa, bụ onye ama ama na Twitter, dere na ụzọ gbachiri na Wuse 2, ebe ụgbọala uweojii na-enwu ọkụ ka ndị Shia na-eme ngagharịiwe.

Efe Tobo Oghozor tinyere kwara ọnu n'ihe na-eme ebe ahụ.

Ngalaba na-ahụ maka ikike dịri onye bụ Amnesty International wepụtakwara ihe ha sị gosiri etụ ngagharịiwe ndị Shia, bụ ndị eji Islamic Movement of Nigeria (IMN) mara na-eme.

Onye were akara @Ajikeade20 tinyere ihe nkiri gosiri ka ndị a na-eche na ha bụ ndị Shia na ndị uweoji na ama aka.

@Gracemama1 tinyere ihe nkiri gosiri ụgbọala uweojii na-enwu okụ.

Akara Twitter ndi Shia tinyere foto ha na-egosi ndi otu ha mgbo tụrụ na Wuse 2.

Akụkọ ga-amasi gi

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a