Etu ndi tọọrọ ụmụ NYSC n'Imo ji danye n'aka ndi uweojii

Ndị ji otu afọ efe Naijiria Image copyright AFP

Akukọ na-erụ anyi ntị na-akọwa na ndị uweojii n'Imo steeti nwụchiri ndị a na-enyo na aka ha dị na ndị na-efe Naịjirịa atọrọla n'ụbọchị 23 nke ọnwa Ọktoba a.

Godson Orlando Ikoku bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo gwara BBC na aka kparala ndị a na-eche na aka ha dị n'ihe mere.

Ṅ'ọnụ Ikoku, ndị NYSC a nọ n'ụzọ ịga zaa aha ha n'ebe oku ala nna kpọrọ ha mgbe ha zutere ndị omekome a n'isi ụtụtụ.

"Mmadụ ano n'ime ndị NYSC a bụ ndị Ọyọ steeti, ọtụ bụ onye Ọshụn Steeti. Ha na-aga Rivas na Akwa Ibom steeti ịza oku ala nna mgbe ha zutere ndị ntọ a na gburugburu obodo Ụmụakpu dị n'okpuru ọchịchi Ọhaji Egbema."

"Ndị ntọ jidere ụgbọala ha, zuo ha ohi ma tọrọ ndị NYSC na otu onye ọzọ mana ọkwọụgbọala nwetara ohere gbaa ọsọ gbaga ebe ndị uweojii nọ nche.

"Ndị uweojii a chụrụla ndị ntọ a baa n'ime ọhịa ebe ha ji ndị a ha tọrọ ma zọpụta ha niile," Ikoku kwuru.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ha jidere ndị a ha na-ebo na ọ bụ ha kpara ike a n'ụzọ abụọ.

"Ndị uweojii nọ ọrụ na mpaghara Nkaraha dị n'Ohaji Egbema nwụchiri ndị a n'ime ụgbọala.

"A hụrụ ihe mgba ama n'aka ha mere e ji nwụchie ha maka ịgba ha ajụjụ ọnụ ebe ha gbara ama na ọ bụ ha tọrọla ndị a na-efe ala nna n'atụmatụ Bekee kpọrọ Nation Youth Service Corps (NYSC)."

Ndị uweojii jidere ndị a bụ ndị si ngalaba 'Anti-Kidnapping Unit' nke uweojii Imo Steeti.

Ndị a aka ji bụ Wisdom Nwobodo, dị afọ 22, ma bụrụkwa onye Ikwerre na Rivas steeti; Okoro Emenike dị afọ 20 sikwa Ikwere; Chukwu Wisdom dị afọ 19 ma bụrụ onye Ụmụakpu nke dị n'Imo steeti.

Ikoku sị na a ga-akpụpụ ndị a ụlọikpe ma ha mechaa nyocha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: