Akụkọ dị mkpa taa: Onye ga-azọta ọkọlọtọ APC n'Imo taa?

Hope Uzodinma na Uche Nwosu

Akụkọ ndị dị mkpa taa

Esemokwu dị n'otu APC n'Imo steeti eyirila trọuza dịka Okorocha na-aba mba.

Aka na-achị Imo steeti agwaala onyeisi otu APC bụ Adams Oshionhole ya rituo n'ọkwa maka mbọ ọ na-agba ị kewa APC.

Ọ na-abịa dịka taa bụ ụbọchị ịkpeazụ tupu INEC akpọpụta aha onye ga-azọ ọkwa Gọvanọ na Naịjirịa niile.

Ọzọ,

Otu ọkaiwu bụ Isaiah Ayụgụ arịọla ụlọịkpe dị n'Abuja ha mee ka Femi Fani Kayode nakwa Enyinnaya Abaribe bịa zara ọnụ ha maka ọsọ Nnamdi Kanu gbapụrụ na Naịjirịa.

O kwukwara ka anwụchie ndị niile katọrọ ndịagha Naịjirịa ma boo ha ebubo ntọrọ Kanu gụnyere onye ọkwaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor.

Na mba ofesi

Mba Zimbabwe ga-ebido ị mịpụta mmanụ agbịdị n'ala ha dịka achọpụtara na enwereike ịnwe ya bụ mmanụ n'ala ha.

Onyeisiala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwagwa zipụrụ ya bụ ozi ma kwukwa na ọrụ ga-ebido n'afọ abụọ na-abịa.

N'egwuregwu,

Nkọwa foto,

Ndị Mamelodi Sundowns nabatara Usain Bolt ọfụma

Dịke n'ịgba ọsọ bụ Usain Bolt apụọla n'otu egwuregwu bọọlụ Mariners nke mba Ọstralia.

O kelere ndị isi otu bọọlụ ahụ ebe ọ nọ anata nkuzi kmegbe ọnwa ọgọst.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla