Minimum wage: Gọọmentị ga-akwụrịrị anyị N30,000

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe onye NLC kwuru

Otu jịkọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ "Nigeria Labour Congress, NLC" agwala onye ọbụla ka ha kwadoo makana abụbọ ọrụ nke ugbua ga aka aka n'ahụ.

Onye isi oche NLC n'Enugwu steeti bụ Virginus Nwobodo kọwara na ha ekwekọrịtaka na ọbụrụ na ndị gọvanọ akachie ntị sị na ha agaghị akwụ N30,000, abụbọ orụ nke ike ya ga amalite n'ụbọchị 6

Nọvemba, 2018.

Nwobodo kwuru na mgbe ya bụ abụbọ ọrụ ga-amalite, ha bụ ndị orụ ga-akwụsị ndị na-azụ ahịa, ụgbọ ala ma ọ bụ ụgbọ elu agaghịagba, ụmụ akwụkwọ agaghị aga, ụlọ ụka agaghị emepe, ebe ụlọ ọgwụ ga akpọchikwa.Onye ọrụ oyibo ahụ kwara arịrị na ebere adịghị gọọmenti n'obi inye nwoke ma ọ bụ nwaanyị ji ezinaụlọ N18,500 dịka opekatampe ndị ọrụ.

Nwobodo dọrọ ndị gọvanọs aka na ntị ka ha tulee na N22,500 ha chọrọ iji bido kwụwa ndị ọrụ ezughị inye ụmụ aka nrị, kwụọrọ ha ụgwọ akwụkwọ, ụgwọ ụlọ ọgwụ, idozi onwe ha nakwa ịkwụ ụgwọ ụlọ.

Nsogbu ndị kwe na ndị ekweghị dị n'etiti ndị ọrụ na ndị gọọmentị bụ nke na-aga n'ihu ka mgbe afọ ole ma ole gara aga.

Ka ọ dị taa, ndị gọvanọ ekwuola hoha na ha agaghị akwụlị N30,000, na ọ bụ N22,500 ka akpa ha ga ebuli, ma otu ndị ọrụ kwuru na ha ekweghị na nkea.

Otu Ndị ọrụ ahụ bụ NLC na aha ịchafụ kwuru na ndị gọvanọ na gọọmenti etiti na-etufu ego na ihe ndị ọzọ ma leghara ndị ọrụ ha anya.

Nwobodo nyekwara nne na nna ndụmọdụ ka ha jide ụmụ ha n'ụlọ, ma kwadoo onwe ha maka ya bụ abụbọ orụ ga-eweta ịkpọchị Naịjiria izu ụka na abia nụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a