Sex doll: Ihe mere ụfọdụ ụmụnwoke ji 'alụ' nwabebi

Nwabebi Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo A na-ere nwa bebi na mba ofesi

Ọ bughi ịhe ọhụrụ na ụfọdụ ụmụnwoke na-ejizi nwabebi eme enyi, kama ihe mgbawoju anya bụ etu ha si azụta ya n'agbanyeghi na ọ dara ọnụ.

Nwoke akpọrọ "Pretty Mike of Lagos" zụtara nwa bebi dịka onyinye o nyere onwe ya n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya.

Kamgbe o wepụtachara foto gosiri ebe ya na nwabebi nọ, ndị mmadụ nọ soshal midia etinyela ọnụ n'okwu ahụ.

Cheta na n'ọnwa Mee nke afọ a, otu otiegwu akpọrọ Shuga Shaa bụ onye Delta steeti kwuru na ọ zụtara nwabebi ya n'ọnụ otu nde naira (N1,000,000).

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị

Ọ zutaara ya ụgboala ma kpọrọ ya na-aga ụlọ ihe nkiri.

Etu o si kwụrụ ugbua, "Pretty Mike of Lagos" depụtara n'elu soshal midia na "ndị mmadụ na-ahụ nwabebi dịka nke e ji enwe mmekọrịta mana mụ onwe m na-ahụ ya dịka onye nkasiobi, onye na-anọkete m

nakwa onye na-agaghị agbaghapụ m."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara