Oshiomhole: Alụmdi na nwaanyị ya na APC ọdabakwara?

Adams Oshiomhole Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018

N'ọnwa Juun nke afọ 2018, mgbe pati nọ n'ọchịchị bụ All Progressives Congress (APC) họpụtara Adams Oshiomhole dịka onyeisioche ha, o kwere nkwa na ọ ga-ahazi nsogbu ndị dị na Pati ahụ.

Ugbua, mkpamkpa a na-anụ n'ime APC mere ka ọ dị ka chi efoghị ọfụma na ngalaba onye na-achị pati ahụ.

Ụfọdụ afo ọrụru ndị a sitere na ntuliaka imeụlọ APC mere.

Cheta na nwunye onyeisiala bụ Aisha Buhari gara n'akara ya na Twitter dee iwe ya maka ntuliaka imeụlọ nke Adamawa steeti, nke nwanne ya nwoke achịtaghị aja na ya.

O kwuru na ọ bụ mpụ na aghụghọ mere nwanne ya jiri daa.

Okwu oriaku Buhari bịara dị ka mbupu okwute nọchiri awa mmiri, makana akụkọ bịazịrị karịa.

Ugbua, Rochas Okorocha bụ gọvanọ Imo na aba mba maka Oshiomhole.

Image copyright Getty Images

Ebe 'ọgbaghara' dị

  • Na Zamfara, Inec sị na APC enweghị onye ga-anọchi anya ha na ntuliaka 2019 makana ha emeghị ntuliaka imeụlọ etu o kwesịrị.
  • N'Imo, ụbọchi nke abụọ nke ọnwa Nọvemba 2018 a ka a ga-ama onye ga-azọ ọchịchị onye ga-achị Imo n'okpuru APC n'afọ 2019. N'otu ebe ahụ, ọgbaghara dịkwa, makana amaghị ma ọ ga-abụ Uche Nwosu maọbụ Hope Uzodimma ga-eburu ọkọrọtọ APC gawa 2019.
  • Na Delta, otu agbụrụ APC kpụpụrụ Oshiomhole na Inec ụlọikpe maka nnupuisi ha sị na o mere iwu ụlọikpe nyere. Ha sị na ụlọikpe machiri Oshiomhole inye Inec aha onye ọbụla maka ịzọ ọchịchị dịka gọvanọ na 2019.
  • N'ogun steeti, APC juru na ha agaghị ewe ndị Gọvanọ Amosu zitere aha ha maka na ha esoghị usoro pati ha kwekọrịtara iji mee ntuliaka imeọlụ.
  • Na Riva steeti, Tonye Dele Cole na Magnus Abe ka na achịpụ ya n'ụlọikpe maka onye ga-anọchite anya APC na steeti ahụ.

N'agbanyeghị obi onugbu a niile, Bola Ahmed Tinubu bụ onye isi APC na Naịjirịa gburugburu, sị na ọ kwụ Oshiomhole n'azụ gidigba.

Tinubu kwuru na pati ha bụ APC kachasị nwee ikike, nke mere na ọ naghị akwado mwepụ onyeisi pati ahụ.

Onyeisiala Muhammadu Buhari ekwubeghị okwu maka ihe a.

Mana, ọ naghị etinye ọnụ n'esemokwu dị n'etiti ndị pati n'ihe.

BBC Igbo gbara ọnụ na-ekwuru APC na Legọs steeti ajụjụ maka ihe a ọ wee gwa anyi na onweghị ihe na-eme n'APC, kama na ihe na-eme bụ ụdịrị ihe a na-ahụ na pati buru ibu etu ahụ, makana onye ọbụla na-achọ ka ọ nọrọ n'ihu oche.

Ọ sị na enweghi onye chọrọ ịnọ n'azụ oche.

"A ga-enwerịrị ndọrọndọrọ makana enweghị onye ga-eke aga n'azụ, ihe niile a bụ ihe ndị na-eme ka e nwee ụdịrị ọnọdụ a. Ọ bụghị ihe ọhụrụ, ọ bụ ihe a na-ahụ mgbe niile," Maazị Igbokwe kwuru.

Ọ gakwara n'ihu sị; "Makana ọ bụ APC nọ n'ọchịchị, a ga-enwerịrị ndọrọndọrọ ahụ. Ka ndị mmadụ ghara ị na-asị na enwere ọgbaghara. A ga-edozirịrị ihe niile a.

Joe Igbokwe si na enweghị mgbe a ga-etinye mmadụ abụọ dịka gọvanọ, enweghị mgbe mmadụ abụọ ga-abụ onyeisiala.

"Ọ bụ otu onye ga-aga, onye nke ọzọ echere oge nke ya. Ọbụghị ihe adịghị eme eme, ọ na-eme, makana ndigbo sị na ọ bụ onye ji igu ka ewu na-esogharị," Igbokwe sị. 

Akụkọ ndị ga-amasị gị: