Anglican Priests protest: Ụlọakwụkwọ Crowther abụghị nke ndị ụka - Gọọmentị Anambra

Ụkọchukwu Image copyright @TheAnglicancommunion
Nkenke aha onyonyo Ndị ụka Anglican chọrọ ka e nyeghachi ha ụlọakwụkwọ ha

Gọọmenti Anambra steeti ekwuola na ọbụghị ndị ụka nwe ụlọ akwụkwọ pramarị Bishop Crowther Memoria dị n'Onitsha.

John Adinuba bụ ọnụ na-ekwuchitere gọọmenti Anambra kwuru na Bishop nke Niger n'ụka Anglican bụ Owen Nwokolo na nwunye ya bụ ndị na-ebugharị okwu ụgha a.

O kwuru na ọ bụrụ na ndị ụka Anglican na-azọ na ọ bụ ha nwe ya bụ ala na ụlọ akwụkwụọ, ha wepụta akwụkwọ maọbụ ihe ọ bụla gosiri nke a.

Adinuba kwuru na kamgbe ndị ụka Anglican rịrọchara ebe ahụ iji wee ka ụka ụbọchị Wednesday ọ bụla kamgbe ọnwa abụọ , ha na-ekwuzi na ọ bụ nke ha.

N'ọnụ ya ,"onye nwe ihe a na-abịa ayọrọ ka o nwere ya mee ihe?"

Ọ dọkwara ha aka na nti na ha dọbata ndị ụka Katọlik n'okwu a makana o nweghị mgbe e ji kwuo na ọ bụ ha nwe ya bụ ala maọbụ ụlọakwụkwọ.

O kwuru na kamgbe ekepụtachara ya bụ ụlọakwụkwọ na nke dị bụ ebe ahụ akpọrọ Ọmụ Nwagboka na ọ bụ gọọmenti na-elekọta ihe niile gbasara ya bụ ụlọakwụkwọ.

John sị na ọ bụ eziokwu na ọ bụ n'ala ahụ ka Crowther tụrụ ukwụ mbụ mgbe ọ biara Anambra mana ọ bụghị ya ga-emezi ka ndị mmadụ kwuo na ọ bụ ndị ụka ya maọbụ ya nwe ya.

Cheta na ihe karịrị ụkọchukwu 200 ụka Anglican si na diocese nke Niger (mpaghara Onitsha) buru ngagharị iwe ha bugara Gọvanọ na-achị Anambra steeti n´ụbọchị November 3.

Akụkọ na-ekwu na ha mere ngagharị iwe a maka ebubo ikpaoke ha na-ebo Gọvanọ Obiano.

Ndị ụkọchukwu a yicha uwe ọcha nọchie ụzọ esi apụ n'ụlọọrụ gọvanọ Obiano ma kwuo na ha ga-anọgide ebe ahụ ruo mgbe Govanọ ga-apụta gwa ha ọkwụ.

Kepukepu na-ekwu na ọ bụ maka ebubo etu gọvanọ Obiano si were ụlọakwụkwọ ahụ nye ndị ụka ya bụ ndị Catholic.

Ndị ụkọchukwu Anglican na-ekwusi ike na ụlọakwụkwọ ahụ bụ nke ha.

Ha ji egwu ma buru akwụkwọ ndeputa gosiri iwe ha nke depụtara ụfọdụ ihe dịka ,"Wiillie Obiano hapụrụ anyi ihe bụ nke anyị,"Gọvanọ Obiano nyeghachị anyị ala nakwa ụlọakwụkwọ anyị, Ndọrọndọrọ ọchịchị okwukwe ga-ebiriri n'Anambra steeti, Ụlọ akwụkwọ pramarị Bishop Crowther Memorial dị na Onitsha bụ nke ndị ụka Anglican."

Ka ọ dị ugbua, gọmentị Anambra kwere nkwa na ya ga-etinye ọnụ na ya bụ okwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a