Gịnị kpatara nwaanyị ji gbuo onwe ya, di na ụmụ ya atọ ?

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionHomicide: Anyị ka na-enyocha ihe gburu ezinaụlọ a-Uweojii

Ndị uweojii nọ na Benue steeti agwaala BBC Igbo na etu ha sị hụ ozu ezinụlọ gụnyere nne na nna nakwa ụmụ ha atọ n'ime ụlọ ha.

Joel Moses bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii kwuru na ndị agbata obi ezinaụlọ a bịara ị kpesara maka ihe mberede a merenụ n'abali ụnyaahụ.

O kwuru na mgbe ya na ndị otu ya wuchiri na be ezinaụlọ a, ha hụrụ ka ozu ha niile tọgbọrọ n'ọbara ma hụ mma dị n'aka nke nne ezinaụlọ ahụ nke pụtara na o

nwereike bụrụ na o magburu onwe ya.

Moses kwuru na ndị agbata obi ezinụlọ a kwuru na ha hụrụ nne ezinụlọ ahụ ebe o ji aka ọdụ esukasi ụgbọala di ya tupu di ya alọta na mgbede ụbọchị ihe

a mere.

O kwukwara na ndị agbata obi gwara ya na di na nwunye a na-alụ ọgụ oge niile.

Moses kwuru na ruo ugbua amabeghị ma ọ bụ nke nwaanyị gburu onwe ya ma gbuo di ya na ụmụ ya.

Mana agbata obi gwara ndị ntaakụkọ na ọghaghị ị bụ nne ezinụlọ a sugburu ndị be ya.

Akụkọ na-ekwu na "internet" bụ na di na nwunye a na-arụ na ụlọọrụ okpuru ọchịchị Makurdi akwụkwọ akụkọ "The nation" siri depụta.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara