Pregnant Nigerian Sisters: Ụwa na-enwe ọṅụ maka ụmụnne atọ tụrụ ime n'otu mgbe

Ụmụnne atọ tụrụ ime n'otu mgbe Image copyright Cynthia "Onye" Onyejiji
Nkenke aha onyonyo Ụmụagbọghọ ndị a bụ Onyeka, Ogechi na Chika bụ ụmụafọ Igbo amụrụ na mba Amerịka.

Ụmụagbọghọ atọ ndị a bụ ụmụnne chọpụtara na ha tụrụ ime n'otu oge ma gosipụta obi ụtọ ha site n'ikesa foto ha na soshal midia.

Ụmụagbọghọ ndị a bụ Onyeka, Ogechi na Chika bụ ụmụafọ Igbo amụrụ na mba Amerịka.

Ha kọwara ndị ntaakụkọ BBC etu obi dị ha mgbe ha chọpụtara na ha atọ dị ime n'otu oge.

Onyeka bụ Ada ha kwuru na obi dị ya ụtọ na ụmụnne ya ga-eso ya keta oke n'ime a ha dị n'ihi na ọ tụrụbuola ime n'oge gara aga.

Chika kwuru na ime ya ji izuụka abụọ karịa nke Onyeka, ebe Ogechi kachasị nta n'afọ ji ọnwa abụọ karịa ha abụọ.

Ha gara n'ihu kwuo na ha na-ekerikọta ihe ọbụla ha nwere n'oge ime ha.

Ha kwuru na ọ bụ Chika wepụtara atụmatụ a mana Onyeka nyere ikike ka ha see foto ma zipụ ya n'akara soshial midia.

Ha kwuru na obi dị ha ụtọ mgbe foto ha gbasasịrị na soshal midia, kwukwa na obi dị nne ha ụtọ nke ukwu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ihe ụmụnwaanyị na-akpa n'azụ ụmụnwoke