Madumere ọ na-akwọzi onwe ya n'ụgbọala?

Akụkọ dị mkpa:

Anapụchaala m ndị ọrụ m - Eze Madumere

Eze Madumere

Ebe foto si, Eze Madumere Facebook

Nkọwa foto,

Eze Madumere na Okorocha anaghị esi otu ụzọ agafe

Akụkọ si n'akụkụ Eze Madumere bụ osote gọvanọ Imo Steeti apụta na-ekwu na gọvanọ Rochas Okorocha anapụla ya ndị na-akwọrọ ya ụgbọala dị mmadụ itoolu.

Ọnụ na-ekwuru Madumere bụ Uche Onwuchekwa, kwuru na nke a bụ ugboro abụọ ụdịrị ihe a na-eme, na anapụbuola ya ndị ọrụ nchekwa ya mbụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na nke a ga-eme ka ndụ Madumere nọrọ n'ọnya ugbua dịka o na-enweghizị ezi nchekwa gbara ya gburugburu.

Mana ọnụ na-ekwuru pati APC n'Imo Steeti bụ FCC jones kwuru na nke a abụghị eziokwu, ebe Ebere Nzewuji bụ onye ndụmọdụ gọvanọ Okorocha kwuru na ọ nụbeghi maka nke a.

Abụbọ ọrụ ndị NLC

Ndị ọrụ NLC

Ebe foto si, AFP

Otu jikọtara ndị ọrụ ụgbọelu na Naịjirịa eyiela egwu na ha ga-agbachi ọdọụgbọelu iji sonye n'abụbọ ọrụ ndị NLC chọrọ ime n'abalị abụọ na-abịa.

N'otu aka ahụ, otu jikọtara ndị ọrụ mmanụ agbịdị na gaasị ekwupụtala nkwado ha n'ebe NLC nọ nakwa isonye na nzọm ụkwụ ọbụla ha mere.

Na mba ọzọ

Ndị ụka kraịst e gburu egbu

Ebe foto si, AFP

Ndị uweojii agbagbuola mmadụ iri na itoolu bụ ndị oyi ndụ egwu a na-enyo enyo gbagburu ndị ụka Kraịst n'Ijipt.

Minista na-ahụ maka ime obodo na mba ahụ kwuru na nke a mere oge ndị a na ndị uweojii na-agbarịkọta onwe ha egbe n'ime ọzara.

N'egwuregwu

Otu egwuregwu Leciester

Ebe foto si, King Power

Ndị otu egwuregwu Leicester City awụchiela na mba Taịland maka olili onye nwe otu egwuregwu ha nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helikọpta.

Vichai na mmadụ anọ ndị ọzọ nwụrụ dịka helikọpta bu ha fepụrụ n'ọgbọ egwuregwu ha ma kpọkasịa n'akụkụ ya n'izu gara aga.

Gere nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo,

Ihe onye NLC kwuru

Oby Ezekwesili akpọọla okwu aha

Oby Ezekwesili

Ebe foto si, Ezekwesili Facebook

Nkọwa foto,

Ezekwesili bidoro otu #BBOG iji gbapụta ụmụaka Chibok

Nwaada Igbo ji ejimba bụ Oby Ezekwesili ekwuola ihe kpatara ya ji tinye isi na Ịzọ ọchịchị onyeisiala Naịjirịa.

Ezekwesili kwuru na ya bụ okenye agaghị a nọ n'ụlọ ewu a na-amụ n'ọgbụ dịka o si dị na gọvement Naịjirịa Ugbua.

Kepukepu maka nw Debe

Dim Odumegwu Ojukwu na Awka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Debe bụ nwa mbụ Odumegwu Ojukwu

Fayose na PDP

Ayo Fayose

Ebe foto si, @GovAyofayose

Nkọwa foto,

E meriri onye osote Gọvanọ Fayose bụ Kolapo Olusola-Eleka na ntuliaka gọvanọ e mere n'Ekiti na nso nso a.

Ụmụibe ka ọ dị ụgbụa, PDP Ekiti steeti ewepụla Ayo Fayose dịka onye ndụ PDP na steeti ahụ.

Onye nọchiri anya ya bụ Biodun Olujimi sị na nwepụ a egosighị na enwere nkewa na PDP Ekiti ka ọ bụ ka ọpụpụ Fayose na ọchịchị ghara imetụta ọganihu pati ahụ.

Referendum na France

France na Caledonia

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Ndí Caledonia kwu na ahírí maka íme ntụlịaka referendụm

Ụnụ anụla e na mba Caledonia dị na france amalitela ntuliaka mnwereonwe akpọrọ referendum.

Onyeisiala France bụ Emmanuel Macron ga-agwa ụwa ihe bụ mpụtara na ya bụ ntuliaka ma ọ kụọ elekere iri na abụọ nke ehihie tata.

N'egwuruegwu,

Fernandinho

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Man City na Southampton ga-achipụ ya taa

N'egwuruegwu che aka ghọrọ asọmmpi ndị Man City na Southampton nakwa nke ndị Chelsea na Crystal Palace malite na elekere atọ nke ihihie tata.

Gee nkeji anyị na ụtụtụ a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ebe NLC na gọmenti etiti na achịpụ ya

Akụkọ ndị a ga-amasị gị ịgụ