Ekweremadu: Ụlọomeiwu chọrọ nyocha ebubo mwakpo ụlọ ya

Ekweremadu Image copyright Ike Ekweremadu
Nkenke aha onyonyo Ekweremadu, nwụnye ya na nwa ya nọ n'ụlo ya mgbe ndị a ji egbe bata

Ndị ụlọomeiwu ukwu enyela ngalaba ha na-ahụ maka ndị uweojii, iwu ka ha mee nyocha gbasara mwakpo a wakporo ụlọ osote onyeisi ha bụ Ike Ekweremadu.

Cheta na a nwụchiri otu nwoke bu egbe banye n'ime ọnụụlọ Ekweremadu, n'ụtụtụ ụbọchị Nọvemba 6, 2018.

Onye a ji egbe ekwubeghi ihe bụ ije ya, mana ndị ma maka akụkọ a kwuru na o so n'ime ndị mibara n'ụlọ Ekweremadu.

Uche Anichukwu, bụ onye ndụmọdụ Ekweremadu n'ihe gbasara ntaakụkọ, zitere BBC akwụkwo mgbasaozi kwuru na ndị amabeghị ndi ha bụ ji nzuzo rịba be Ekweremadu n'ọnụ ụtụtụ taa.

Anichukwu sị na ndị batara be Ekweremadu jidere nwa ya nwoke wee sị ya kpọrọ ha gawa ebe nna ya nọ.

Anichukwu gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ mgbe ndị a na Ekweremadu na-ama aka ka ndị nchekwa gbatara bịa zọpụta ya ma jide otu onye n'ime ndị mwakpo a.

Image copyright Uche Anichukwu
Nkenke aha onyonyo Osote onyeisi ndị uweojii Joshak Habila agala ịhụ Ekweremadu

Dika Uche siri dee, onye eji aka nwere ọtụtụ ihe eji awakpo ụlọ nakwa ngwa agha ndi ọzọ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na onye a aka ji ekwebeghị ikwu ije ya.

Anichukwu sị na ọ bụ ogbugbu ka ndị bịara igbu Ekweremadu na ndị be ya.

BBC kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naịjirịa bụ Jimoh Moshood mana ndị nọ n'ụlọọrụ ya kwuru na ya na onyeisi ndị uweojii Naịjirịa nọ na nzukọ, ma gakwa n'ihu kwuo na ha anụbeghị kepukepu ọbụla banyere ihe mere na be Ekweremadu.

Ekweremadu n'onwe ya mechara tinye ọnụ n'ihe mere ya n'Ụlọomeiwu.

Ọ sị na ha lanyere onye a ejidere na be n'aka ndi uweojii.

Ma gakwa n'ihu katọọ etu ndi uweojii jiri kpa agwa. Ọ sị na ha mere ka ha kpụọ onyeisi ndi uweojii bụ Ibrahim Idris n'ekwentị mana ọgaghị.

"Ọ bụ n'elekere anọ nke ụtụtu ka ndị mmadụ wakporo be m, wee ruo ime ụlo ebe mụ na nwụnye m dina.

"Anyi kpọrọ onyeisi ụloọrụ uweojii dị na Akpo. Anyị ahụghị ya ruo elekere ise na ọkara. ọ bụ osote ya ka o dunyere. Ka ọ hụchara ngwa agha ndị a ji bịa, ọ la sị na onyeisi ya ga-abịa.

Ruo elekere itoolu m pụrụ na be m, ahụbeghi ya."

Ekweremadu gakwara n'ihu kwuo na onweghi onye nwere nchekwa n'obodo Naịjirịa.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a