Minimum Wage: Buhari ga-eleba anya n'ịkwụ N30,000

Buhari na ndị Ọrụ na-eme ngagharị iwe

Ebe foto si, Getty Images

Gọomentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-elebanye anya n'ihe gbasara N30,000 bụ ego NLC chọrọ dịka ụgwọ ọnwa opekatampe.

Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuputere nke a na nzukọ ya na otu akpọrọ "tripartrite committee" n'asụsụ Bekee nwere n'Abuja taa bụ Nọvemba 6, 2018.

Buhari kwuru na ọ ga-ezigara Ụlọomeiwu Naịjirịa akwụkwọ gbasara mkpebi a.

Ọnụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasa ozi ọgbara ọhụrụ bụ Bashir Ahmed, tinyere ihe nkiri si na nzukọ ha n'elu Twitter ya.

N'aka ọzọ, ọnụ na-ekwuchitere ya n'ihe gbasara mgbasa ozi bụ Garba Shehu, zipuru ozi ihe Buhari kwuru na nzukọ a.

Gụọ ha ebe a:

N'akụkọ ọzọ,

Ndị ụlọomeiwu ukwu enyela ngalaba ha na-ahụ maka ndị uweojii, iwu ka ha mee nyocha gbasara mwakpo a wakporo ụlọ osote onyeisi ha bụ Ike Ekweremadu.

Ekweremadu na osote onyeisi ndị uweojii Joshak Habila

Ebe foto si, Uche Anichukwu

Nkọwa foto,

Osote onyeisi ndị uweojii Joshak Habila agala ịhụ Ekweremadu

Cheta na a nwụchiri otu nwoke bu egbe banye n'ime ọnụụlọ Ekweremadu, n'ụtụtụ ụbọchị Nọvemba 6, 2018.

Abụbọ-ọrụ ASUU

Ọkammụta Ogunyemi bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka ọdịnma ndị nkuzi na mahadum bụ ASUU, kwuru na ụfọdụ nkwa gọọmentị kwere otu ha na-emezughi emezu n'afọ 2009, so n'ihe ha na-ana gọomentị ruo ugbua.

Ọ gwara BBC Igbo na ndị ASUU mahadum ruru iri isii bịara nzukọ ha mere, ebe ha kwekọrịtara na ha ga-esonye n'abụbọ-ọrụ a ma hụ isi ya.

Na mba ofesi,

Amerịka emeela ntuliaka 'mid-term' ha ga-eji họpụta ndị ụlọomeiwu ukwu, nke nta na gọvanọ steeti iri atọ na isii.

Ntuliaka 'mid-term' Amerịka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Ndị mmadụ ebidola ịtụ vootu

Otu nwaafọ Igbo bụ Nnamdi Chukwuocha so na ndị na-azọ ọkwa ọchịchị, ebe ọ na-ele anya ịnọchite anya ndị obodo Delaware.

N'egwuregwu Champions League,

Barcelona na Inter Milan ga-ama onye ike ga-agwụ mgbe ha zutere n'Itali,

Ebe PSG na Napoli, Tottenham na PSV Eindhoven, Atletico Madrid na Borussia Dortmund nakwa Liverpool na Red Star Belgrade ga-akụkọtakwa mpi.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri:

Aha onyonyo,

ndị ishi na-agụ egwu