Social media: Chee ya echee tupu ị mee ihe isii a

Ihe ị na-agaghị eme na soshal midia Image copyright Getty Images

Ọtụtụ oge ka ndị mmadụ ji aka ha kotere onwe ha okwu site n'ụdịrị ihe ha tinyere na soshal midia ha.

Tupu ị mara ụdịrị nsogbu ị dabara n'ime ya maọbụ ịchọta etu ị ga-esi apụta na ya, ọ banyela n'ihe ịta ikikere eze.

Mana BBC chọrọ inyere gị aka makana Igbo kwuru sị na "agha e yiri eyi anaghị eri nwa ngwọrọ".

Ihe ị ga-agbara ọsọ na soshal midia

Enweghị ihe ọzọ ị ma maka soshal midia, mara na ọ naghị echefu ihe echefu.

Enweghi ihe banyere na ya mmadụ agaghị achọtanwu, n'agbanyeghi afọ ole ọ ga-ewe.

1) Esela onwe gị ebe ị gba ọtọ:

Ọhụrụ ọhụrụ a, ọdịghị ka e nweela ihe ka etinye ndị mmadụ na nsogbu na soshal midia karịa ihe nkiri maọbụ foto na-egosi ka ha gba ọtọ.

Image copyright Getty Images

Ụfọdụ bụ ndị sere foto maọbụ mee ihe nkiri zigara ndị ha che hụrụ ha n'anya, mana ha tụgharịrị azụ tinye ya ebe ụwa niile ga-ahụ ya.

Ndị ọzọ bụ ndị hapụrụ ndị mmadụ ka ha see ha foto, mgbe okwu dagharịrị, ha ekesaa ya iji mee ka ndị mmadụ taa ha ụta.

Ya mere, ọ bụrụ na ị segodu onwe gị foto maọbụ mee ihe nkiri, gbaa mbọ hụ na ọ banyeghị na soshal midia (hichaa ya n'ekwentị), ka ọ ghara ịbịa tụọ gị mbọ n'ike n'ọdiniihu.

2) Chee ya eche tupu ị tinye foto ụmụ gị:

Ọtụtụ oge ka ị ga-ahụ foto ụmụaka, ma hụkwa ebe ọtụtụ ndị na-ekesa ya ma ọ bụrụ na ha 'mara mma'.

Image copyright Instagram/2niteflavour

Mana ị ma na foto ndị ahụ nwereike itinye ha na nsogbu?

Ndị na-atọ mmadụ nwereike isi na foto ị tinyere na soshal midia gị hụwa ihu ụmụ gị ama, chọrọ ha gaa n'ụlọakwụkwọ (ọdịghị mma itinye aha ụlọakwụkwọ ha).

Ọbụghịkwa naanị ndị ntọ o, kedụkwanụ maka ndị okokporo na-awakpo ụmụaka?

3) Akara ekwentị gị:

Ọ bụrụ na ị bụghị onye ọ dị mkpa iji akara ekwentị ya azụ ahịa, ọ bara uru itinye ya na soshal midia?

Image copyright Getty Images

Ị were akara ekwentị gị (nke na-agbasaghị azụmahịa gị) tinye na soshal midia, ọtụtụ ndị ị ma na ndị ị maghị ga-ebido ịkpọ gị.

N'aka ọzọ, ndị na-egwu mmadụ 'chandum' nwereike iji gị gwọrọ abacha.

4) Tulee uche gị tupu ị tinye ebe ị bi:

Ekwesịrị ịgwa gị nke a?

Ụwa emebiela ugbua nke bụ na ndị omekome nwereike ịchọrọ gị bịa ebe ị bi site n'ihe ha chọpụtara n'aka gị site na soshal midia gị.

Image copyright Getty Images

N'otu aka ahụ, soshal midia gị sị gị kwuo ebe ị nọ, nke bụ 'check in' na Bekee, gbachị ya nkịtị.

Makana ide ebe ị nọ nke bụ 'location' na Bekee, nwereike ibutere gị otu nsogbu n'ime abụọ a:

  1. Ndị ohi nwereike iji ohere a mara na ị nọghị n'ụlọ, bịa zuo gị ohi.
  2. Ndị na-atọ mmadụ nwereike ịbịa tọrọ gị maọbụ si ebe ahụ na-ede gị ruo mgbe ha ga-awakpo gị.

5) Taa okwu ata tupu ị kwuo ya:

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị ezutela di maọbụ nwunye ha nakwa ezigbo enyi ha n'elu soshal midia, mana ụfọdụ ezutekwala ọnwụ ha otu ebe ahụ.

Ya mere, chee okwu gị echee tupu ị gwa onye ị na-amaghị okwu na soshal midia.

Kedụ uru ọ ga-abara gị ịkọrọ onye ị na-amaghị ihe dị omimi gbasara gị?

6) Ọrụ gị:

Ị bụrụ onye na-arụ ọrụ Bekee maọbụ na ị na-efe mmadụ n'ụzọ ọbụla, tulee echiche obi gị tupu ị tụpụta ya.

Image copyright Getty Images

Soshal midia na-enyezị ndị mmadụ ọrụ ugbua, mana ọ na-anapụkwa ndị mmadụ ọrụ.

Ọhụrụ ọhụrụ a, ụfọdụ ụlọọrụ na-enyocha etu onye ha were n'ọrụ maọbụ ha chọrọ iwe n'ọrụ, si akpa agwa na soshal midia.

N'otu aka ahụ, ọ bụrụ na ị bụ onye ọrụ ya adịghịzị enye obiọma, maọbụ na enwere onye na-achọ gị okwu n'ọrụ, gbalịa hụ na ị deghị ihe ọbụla gbasara ya na soshal midia, makana ị maghị ebe ọ ga-agaru nakwa onye ga-ahụ ya.

Ị mụtala ihe n'akụkọ a? Ngwa sị BBC Igbo ndeewo.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Instagram e meela m ọgaranya' - Josh2funny