PDP ekwuola na ha amaghị ebe Uche Ekwunife kwụ ugbua

Akụkọ dị mkpa

Uche Ekwunife ọ gala PDP?

Image copyright Uche Ekwunife Facebook

Onyeisi otu PDP n'Anambra steeti bụ Ndubuisi Nwobu, ekwuola na ya amaghị ma Senatọ Uche Ekwunife alaghachitela pati ha.

O kwuru nke a maka kepu kepu na-ekwu na Ekwunife ahapụla APC gawa pati ha.

Lai Mohammed o kwuru eziokwu?

Image copyright Getty Images

Minista na-ahụ maka mgbasa ozi bụ Lai Mohammed ekwuola na gọọmentị ji ego karịrị nde naira atọ enye Ibrahim El-Zakzaky nri kwa ọnwa.

Ndị otu El-Zakzaky bụ onyeisi ndị otu kpọrọ onwe ha 'Nigeria Islamic Movement' nke gọọmentị nwụchiri kemgbe 2015, gwara BBC na Mohammed tụrụ asị.

N'ofesi,

Image copyright Getty Images

Otu nwoke agbagbuola mmadụ iri na abụọ n'obodo Califonia dị na mba Amerịka.

Ndị uweojii kwuru na ndị a agbagburu na-eme mme mme ndị ụmụakwụkwọ oge nwoke ahụ batara ebe ahụ malite ịgba egbe.

Leicester City

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, otu Leicester City ga-eyi uwe e dere aha onye isi ha nwụrụ anwụ n'asọmpi ha ga-agba na ngwụcha izuụka a.

Njem nleta Ọkparaeze Charles

Ọkparaeze Charles nke mba Briten bụ onyeisi otu CommonWealth wuchiri na Legọs ụnyaahụ n'ime njem nleta ọ na-eme na mpaghara Afrịka.

Ndigbo nakwa ndị agbụrụ Naịjirịa ndị ọzọ bịara nabata Ọkparaeze Charles n'ụzọ pụrụiche gụnyere ịgba egwu na ihe nkiri dị iche iche.

Charles kwuru na oke mgbanwe dị iche adịla na Naịjirịa kamgba afọ iri atọ gara aga ọ bịara nke mbụ.

Ọnọdụ ọjọọ ọdọụgbọelu Enugwu

Image copyright Getty Images

Ọdọ ụgbọelu dị n'Enugwu bụ ọnya ọnwụ na-achọ onye ọ ga-ama, nke a bụ okwu Diretọ otu jikọtara ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ bụ Simon Uchenna Ortuanya.

O kwuru na ọkụ anaghị enwu n'ụzọ ebe ụgbọelu na-agba bụkwa nke nwere ohoro ma rụọ gọọmentị etiti ka ha gbata ọsọ enyemaka n'egbughi oge.

Ortuanya gara n'ihu kwuo na ọdọụgbọelu a bụ ihe ndị ndọrọ ndọrọ ji achọ vootu n'aka ndị Igbo n'oge ntuliaka ọ bụla.

Ndị ụkọchukwu Katọlik atọọrọ

Image copyright Getty Images

Ndị ntọ atọọrọla ndị ụkọchukwu ụka Katọlik anọ n'etiti okporoụzọ Agbor na Umutu nke Delta Steeti dịka ha si ọgbakọ na-alọta.

Ndị ụkọchụkwụ a gụnyere Victor Adigboluja, Anthony Otegbola, Joseph Idiaye na Obadjere Emmanuel.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Delta Steeti bụ Andrew Aniamaka kwuru na nke a bụ eziokwu na nyocha ka na aga n'ihu ịmata ndị mere na etu ihe a ji mee.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Manchester United si na-azụ were ọkpụ goolu abụọ asatara otu nyụọ ndị Juventus ịkpakwụ n'ụlọ ha n'asọmpi Uefa Champịọns

Ebe Manchester City nwetere mmeri ha kachasị n'asọmpi ahụ site n'ịgba ndị Shakhtar Donetsk ọkpụ isii chara acha.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionTraffic Control Queen: Ndị ụgbọala Danfo na-enye m nsogbu

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a