Abubakar Shekau awụpụtala ọzọ ime ndị agha Naịjirịa akaja
Akụkọ dị mkpa

Ebe foto si, Getty Images
Abubakar Shakau ezipụla ihe nkiri ọhụrụ gosiri oge ndị otu ya wakporo ndị agha Naịjirịa n'obodo Kumshe na Borno steeti na ngwụcha izuụka garaga.
Ihe nkiri a rutere ndị ntaakụkọ Sahara Reporters aka gosikwara egbe na mgbọ dị icheiche ndị Boko Haram sị na ha napụrụ ndị agha Naịjirịa.
Shekau pụtakwara n'ihe nkiri ọzọ na-eme ndị agha Naijirịa akaja.
APC apụtaghị n'akwụkwọ Inec n'Imo

Ebe foto si, Getty Images
N'Imo, INEC edepụtala aha ndị niile ga-azọ ọkwa dịka gọvanọ na steetị ahụ mana onweghị aha ọbụla pụtara n'okpuru otu pati APC.
Cheta na Hope Uzodinma na Uche Nwosu bụ mmadụ abụọ ka na-azọ onye ga-azọ ọchịchị dika gọvanọ n'okpuru APC n'ulọikpe.
Onye sụrụ ndị mmadụ mma anwụọla

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, nwoke sụrụ mmadụ atọ mma na Australia anwụọla n'ụlọọgwụ.
Ndị uweojii akpọghị aha nwoke a mana ha sị na ọ dị afọ iri atọ na otu nakwa bụrụ onye mba Somalia.
Jose Mourinho agwala Man U okwu ike

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, agbanyeghị na Man U meriri Juventus ọkpụ abụọ asatara otu, aka na-achịkọta ha bụ Jose Mourinho ekwuola na otu dị iche iche ga na-emeri Man U maọbụrụ na ha jụ na agaghị eto.
Mourinho kwuru na ọdịghị mma na oge ọbụla ka ha na-esi azụ emere ndị ha meri n'asọmpi dị iche iche.
Okorocha na Hope Uzodinma

Ebe foto si, Getty Images/Hope Uzodinma/Facebook
Gọvanọ Rochas Okorochas nke Imo steeti ekwuola na onweghi onye maara Hope Uzodimma bụ onye ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ na Steeti ahụ.
N'akwụkwọ ozi si n'aka onye odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Sam Onwuemeodo, Rochas kwuru na Uzodinma abụghị onye APC.
N'aka nke ọzọ onye isioche ndọrọ ndọrọ ọchịchị Hope Uzodinma bụ Declan Emelumba kwuru na Okorocha na-arọ nrọ n'okwu ndị a ọ na-ekwu.
Naịjirịa bụ mba abụọ kacha anyụ nsị n'ezi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ onye ikpeazụ ga-ebinye aka n'akwụkwọ maka ịhazigharị ụsoro ntụliaka ndọrọndọrọ ọchịchị ụgbụa
Naịjirịa bụ mba nke abụọ na mba ndị kachasị anyụ nsị na mbara ezi na mba ụwa niile.
Nke a mere onyeisiala Buhari ji gbarụọ ihu ma tinye ọnọdụ gbatagbata n'ụlọọrụ na-ahụ maka mmiri, ịdị ọcha nakwa idebe ebe ọcha na Naịjirịa.
Mba Ethiopia

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na mba Ethiopia ekwuola na ha achọpụtala otu ili nwere ozu mmadụ narị abụọ dị na agbata Somali na Oromia.
Ntaakụkọ kwuru na a chọpụtara ili a oge a na-eme nyocha banyere ihe ọjọọ niile onye bụbu onyeisiala ha bụ Abdi Mohammed mere.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-agbara Arsenal bọọlụ bụ Danny Welbeck enwetela mmerụ ahụ n'ime asọmpi ha gbatara ụnyaahụ.
Onye nchịkọta ha bụ Unai Emery kwuru a na-eche na mmerụ ahụ buru ibu.
Nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri
A na-ajụ ma abụ m mmadụ - Nigerian Jackie Chan