Air Peace: Ndị njem echela ọkpọ n'Enugu maka akpa ha a hapụrụ na Lagos

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAir Peace: Onye njem agbaala ama maka ihe ụgbọelu ahụ mere akpa ya

Mba rịrị onwe ya elu n'Enugwu n'isi ụtụtụ a ka ndị so ụgbọelu Air Peace si Legos lọta Enugwu chọwara akpa ha n'ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam.

Ndị so ụgbọelu sị na njem gara n'udo site Legos ruo Enugwu.

Mana, ka ha ruru Enugwu, ha chopụtara na akpa ha esoghi ha lọta.

Otu n'ime ndị a aha ya bụ Ogbonna Obi kwuru na ọ bụghị izizi udiri ihe a na-eme n'ụgbọelu Air Peace.

Ndị ọzọ so ụgbọelu a gwara BBC na ndị ọrụ Air Peace kwuru na akpa ha ga-apụta n'elekere atọ nke ehihie.

Otu nwaanyi na-achọghị ka egosi ihu ya na onyonyo so n'ụgbọelu ahụ bara ezigbote mba.

Ọ sị na ọ bụ makana ọgwụ nne ya ga-eji mee ọwụwa ahụ n'ụtụtụ a dị na akpa ha echezọrọ na Lagos.

O kwuru na agaghị achọtalị ọgwu ahụ n' Enugwu.

N'ọnụ ya, "Ebumnobi m niile bụ na m ga-anọnyere nne m ma a na-awa ya ahụ."

Maazi Obi si na ya ga-agba mbọ hụ na ndi mmadụ matara maka ihe mere, ma kwukwa na ọ dịghị mma ka a na-anụ na nti na ụlọọru na-ekwu na ha chọrọ ibido gbawa mba ofesi na-eme ụdịrị ihe a.

BBC gbara mbọ ịnwete Air Peace ka anụta olu ha maka ihe mere.

Chris Iwarah, bụ ọnụ na-ekwuru Air Peace, sị na ihe a abughị ihe ọhụrụ kamana ọ na-eme mgbe niile n'ụgbọelu ọbụla.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara