Aha Uche Nwosu na Hope Uzodinma adịghị n'ime aha Inec wepụtara n'Imo

Hope Uzodinma na Uche Nwosu Image copyright Hope Uzodinma/Facebook/APC Imo state
Nkenke aha onyonyo Amabeghí ka APC Imo o ga-agba aka.

Ọnụ na-ekwuru APC n'Imo bụ FCC Jones Onwuasoanya ekwuola na ọ bụ eziokwu na ha Uche Nwosu na Hope Uzodimma adịghị n'akwụkwọ bu aha ndị ga-azọ oche dịka gọvanọ Imo steeti n'afọ 2019 nke Inec tapesara n'ụlọọrụ ha n'Owere taa.

Uche Nwosu na Hope Uzodimma so n'ime ndị zọrọ ị bụ onye ga-ejide ọkọrọtọ APC na ntuliaka nke 2019.

Ha abụọ na-esi ọnwụ na ọ bụ ha meriri ntuliaka ahu, nke mere eji wepu okwu ahụ n'ụlọikpe.

Maazi Jones Onwuasoanya sị na ọ bụ maka mkpebi otu n'ime ụlọikpe ji okwu a mere maka ya mere Inec ghara eweputa ha onye ọbụla.

Ọ sị na Inec kwanyere ụlọikpe uwgu ruru ha.

Jones Onwuasoanya sịkwa na ya che na APC nke Imo nwere onye ga-ejidere ha ọkọrọtọ.

Ọ sị onye ahụ bụ Uche Nwosu.

Aha ndị a etinyere n'ụlọọrụ Inec n'Imo bụ imezu nkwa Inec kwere na ha ga-ewepụ aha ndị niile ga-eso zọ ọchịchị na 2019 taa.

Ndi aha ha di n'ime akwụkwọ a gunyere Emeka Ihedioha nke Peoples Democratic Party (PDP), Ifeanyi Ararume nke All Progressives Grand Alliance (APGA), Michael Ikoku nke Young Democratic Party na mmadụ iri isii na anọ ọzọ.

BBC Igbo gbara mgbọ ịnweta Uche Nwosu na Hope Uzodinma ka ha tinye ọnụ n'okwu a.

Ekwentị Hope Uzodinma dara ụda mana ọzaghi.

Anyị enwetaghi Uche Nwosu.

Akụkọ ndị ga-amasị: