Peter Obi: El-Rufai gbaara okwu akpọmasị ọsọ

El-Rufai/Obi Image copyright Getty Images/ Facebook page El-Rufai
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ katọrọ ihe El-Rufai depụtara n'akara Twitter ya

Aka chịburu Anambra steeti bụ Peter Obi ekwuola na ihe El-Rufai kwuru maka ya gbawojuru ya anya nke ukwuu.

Ọ jụkwara ebe ụdịrị okwu akpọmasị nkea si banye echiche El-Rufai.

Peter Obi kwuru nke a mgbe ya na ụmụntorobia Nnewi na-enwe mkparịtaụka n'ụbọchị November 10, 2018, dịka onye ozi ya bụ Ọkaiwu Valentine Obienye siri gwa BBC Igbo.

N'ọnụ ya: "echere m na mmadụ na-agbagote n'afọ ọ taa okwu ya ata tupu o kwupute ya. Kedụ ka ihe mere mgbe ahụ siri yite ịkpa oke agbụrụ?

"Naanị ihe e nwereike imere ndị dị ka El-Rufai bụ ikpere ha ekpere ma tie ha aka n'obi ka ha tinye uchu n'ime ihe niile ga-abara ụmụ Naịjirịa uru karịa ma ị na-ekwu okwu ga-etisa obodo Naịjiria."

Obi kwuru na oge dịka nke a nọ n'ime ya ugbua na Naịjirịa, ndị ọchịchị kwesịrị ị na-eme ihe ga-akwalite ụmụ Naịjirịa mmụọ ma na-egbo ọtụtụ mkpa na-akpa ha.

Gbasara okwu El-Rufai kwuru na anwụchiri ya n'Anambra mgbe a na-eme ntụliaka n'obodo ahụ, Obi kwuru na ọ ma na ọ bụ ndị nche sị ya agagharịla na steeti ahụ makana o kwesịghị ịnọ n'Anambara oge ahụ.

Obi kwuru na ya onwe ya agaghị agawa Kaduna ụbọchị a na-eme ntụliaka.

Ọ rịọrịọ ndị Naịjirịa tụmadị ndị nọ n'ọchịchị ka ha kwe ka ịhụnanya karịa okwu akpọmasị n'ihe ọbụla ha na-eme.

Nasir El-Rufai depụtara n'akara Twitter ya na Peter Obi chịbụrụ Anambra steeti bụ onye na-akpa oke agbụrụ nke ọjọọ ya.

O kwuru na ndị mmadụ kwuru na Peter Obi sị na ndị SSS mere ọfụma ịnwụchị El-Rufai ruo abalị abụọ n'ụlọ oriri makana ya bụ El-Rufai enweghị ihe ọ bịara ịchọ n'Anambara.

El-Rufai kwuru na ọ kpọpụrụ ndị otu SSS n'ụlọikpe maka ihe mere oge ahụ, ma kwuo na ha ga-akwụ ya ego ruru nde naira anọ.

Ka ọ depụtachara ya bụ ihe n'akara Twitter ya, o mekwara ka ndị mmadụ hụ ihe otu akpọrọ @Cobom2019 na-ahụ na-eweghachitere Buhari na osote ya na ntuliaka na-abịanụ depụtara.

Mana kamgbe El-Rufai depụtachara ihe a n'akara Twitter ya, ndị mmadụ asaala ya ọtụtụ ihe

@realFFK kwuru na ọhụ onye na-akpa oke agbụrụ mana Peter Obi abụghị otu n'ime ha.

@dimas4real kwuru na El-Rufai ekwesịghị ị na-ekwu ụdịrị okwu a makana nke ọ na-eme ka njọ.

@Chidi kwuru na El-Rufai kwesịrị ị na-atụ onwe ya aka ịkpa oke agbụrụ.

@ChinweOfoha kwuru na agaghị akọli akụkọ gbasara ịkpa oke agbụrụ ghara ịkpọ aha El-Rufai.

Mana enwekwara ndị kwadoro ihe El-Rufai kwuru

@RealOilsheikh kwuru na ndị ugwu agaghị echefu ka Peter Obi si wekọrọ ụlọ azụmahịa ha ma gwa ha depụta na ha abughị ndị Anambra steeti.

@scrrrryy_Rd kwuru na ndị dịka Peter Obi ga-aghasa obodo Naịjirịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a