Ndị omekome agbagbuola onye uweojii na Delta

Akụkọ dị mkpa

Ndị omekome gbụru onye uweojii na Delta steeti

Image copyright AFP

Akụkọ si Delta steeti Pụta na-akọwa na ndị omekome gbaburu otu onye uweojii ma merụọ ndị ọzọ ahụ n'Asaba bụ isi obodo steeti ahụ.

Ndi ajọ obi a nara ndị uwejii a egbe atọ ka ha kpachara ike a.

Mberede okporoụzọ ataala isi nwoke n'ezinaụlọ ha

Image copyright @rrslagos
Nkenke aha onyonyo Ihe ruru mmadụ iri merụrụ ahụ tụpụ atọ anwụọ

Akukọ ọzọ na-agba anya mmiri bụ nke si Anambara steeti ebe mberede okoro ụzọ tara isi ezinaụlọ na Nkwelle Ezunaka junction dị n'okpuru ọchịchị Oyi.

Anya hụrụ mgbe omere kwuru na ọ bụ otu nwoke, nwunnye ya, ada ya nwannyi na nne nwunnye ya ka ajọ chi zutere mgbe ụgbọala ha nọ n'ime ya na gwomgworo kpiakọrọ.

Mmadụ 30,000 si Kamerun agbatala Naịjirịa ọsọ ndụ

Image copyright Getty Images

Ngalaba na-hu maka mba ụwa bụ United Nations ekwuola na ihe karịrị mmadụ puku iri atọ esila Kamerun agbata ọsọ ndụ na Naịjirịa.

United Nations sị na ndị a, nke ọkachasị ha bụ ụmụnwaanyị na ụmụaka na-agbala nsogbu dị na mpaghara ọdịda anyanwụ Kamerun ọsọ.

Na mba ofesi

Image copyright EPA

Aka na-achí mba Frans na Jamani bụ Angela Merkel na Emmanuel Macron zutere na Compeigne, bụ ebe Jamani nọ chilie aka elu na ike ọgụ agwụla ha n'afọ 1918.

Emume a so n'ihe a na-eme iji cheta afọ 100 kemgbe anụchara ọgụ a akpọrọ Wold War One.

Ụkọchukwu Katọlik anọ

Image copyright Getty Images

Atọghapụla ndị ụkọchukwu Katọlik anọ a tọrọla n'ụzọ Agbọ dị na Delta steeti, ụbọchị ole na ole gara aga.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Delta steeti bụ Andrew Aniamaka, kwuru na ha nwụchikwara ụfọdụ ndị maka ya.

Ụkọchukwu anọ ahụ bụ Victor Adigboluja nke ụka dị n'Ijebu Ode dayọsis; Anthony Otegbola, nke Abeokuta dayọsis; Joseph Ediae, nke Benin achdayọsis; na Emmanuel Obadjere, nke Warri dayọsis.

Shiites na gọomentị etiti

Ndị otu "Islamic Movement of Nigeria" nke e ji Shiites mara, ekwuola na gọọmentị ji aha onyeisi ha bụ Ibrahim El-Zakzaky ezu ego, makana ọ bụ ya ji aka ya elekọta onwe ya na nga.

Image copyright Getty Images

Ha kwuru nkea ka akụkọ pụtara ebe Lai Mohammed na-ekwu na gọọmentị na-eji ihe karịrị nde naịra atọ elekọta ya n'ime otu ọnwa.

Na mba ofesi,

Alexandria Ocasio-Cortez bụ nwata nwanyị kacha nta na-enweta oche n'ụlọomeiwu ndị mba Amerịka, ekwuola na o nweghị ego o ji akwụ ụgwọ ụlọ.

Image copyright Reuters

O kwuru na ọ gaghị akwụnwu ya ruo mgbe ọ ga-erite ụgwọ ọnwa mbụ ya ma o bido ọrụ na Jenụwarị.

N'egwuregwu,

Otu Leicester City na-akwado iguzo ihe a kpụrụ akpụ onye nwe ha nwụrụ anwụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta gburu mmadụ anọ ndị ọzọ.

Image copyright Getty Images

Nwa ya nwoke bụ Aiyawatt kwuputara nkea dịka ọ na-ekwu na ịkpụ ya ga-eme ka ọ nọrọ n'obi ha ebighebi.

Gee akụkọ BBC n'otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionA na-ajụ ma abụ m mmadụ - Nigerian Jackie Chan