Naira: Gịnị ka N5 ga-azụtanwu ugbua?

Naịra ise
Nkenke aha onyonyo E biputara naịra ise na 'polymer' n'afọ 2007

N'ime afọ ole na ole, uru ego dịka naịra ise agbadaala ọfụma, nke mere na ọ na-arazị ahụ ịhụ ihe ọ ga-azụtanwu.

N'agbanyeghị na e bipụtara akwụkwọ naịra ise ọhụrụ n'afọ 2007, ego ahụ erughị eru wee gbadaa n'uru, ọkachasị ka akụnaụba Naịjirịa malitere ịgbada n'uru.

Enwere oge naịra ise nwere ike ịzụta ọtụtụ ihe dịka blomblom, ihe nracha ọtọbịrịbịrị "chewing gum" na "sweet", achịcha Bekee, mana ugbua, ọ dị ka anaghị ahụ ya n'ahịa ma ya fọdụzịa ihe o nwereike ịzụta.

BBC jụrụ ndị mmadụ "O nwere onye ka na-ahụ ego a anya? Gịnị ka ị ga-ejinwu ya zụta n'ahịa?"

Ihe ha zara

Ken Nwankwọ sị na ego a ka dị, mana ebe o si dị njọ bụ na enweghị ihe ọ na-azụtanwuzị ugbua.

Ugonna Okeke kwuru na oge ọ na-aga akwụkwọ, onye naịra ise dị ka 'odogwu'.

Mana Ezemokwe Ifeanyi kwuru na naịra ise ka na-azụtanwu ihe n'ugwu awụsa ebe o bi.

Opara Nkechi kwukwara na n'eziokwu, naịra ise ka na-azụtanwu ihe n'ugwu awụsa.

Njirimara ego naịra ise

  • E biputara naịra ise na 'polymer' n'afọ 2007.
  • E biri Tafawa Balewa n'ihu ya, ma dekwa 'five naịra' n'asụsụ Igbo, Hausa na Yoruba n'azụ ya.
  • E sekwara ndị si mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa na-agba egwu mkpọkịtị n'azụ ma nke ọhụrụ ma nke ochie (a kwụsịrị ikesa nke ochie n'afọ 2007 tupu nke 'polymer' apụta).
  • N'azụ nke a kwụsịrị ikesa n'afọ 1984, e sere onye na-eke nkwụ.

Lee ihe ọzọ ndị mmadụ kwuru na Facebook ndị BBC Igbo:

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara