Awakpoola Atiku n'ọdọụgbọelu dị n'Abuja - PDP
Akụkọ dị mkpa
Awakpoola Atiku - PDP
Ebe foto si, Getty Images
Otu Peoples Democratic Party (PDP) edepụtala akwụkwọ ozi ebe a na-ebo ebubo na ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa nwakporo onye jị ọkọlọtọ ha n'aka bụ Atiku Abubakar n'ọdọ ugbọelu taa bụ Nuvemba 11 n'Abuja.
PDP ga n'ihu kwuo na ndị nche a banyere n'ime ụgbọelu Atiku nakwa kposasi ebe niile n'ime ụgbọelu a na-acho ihe ekweghi ikpọ aha.
Ha kwukwara na ha lebere anya na ekwenti Atiku nakwa akwụkwọ dị iche iche o ji eme nkwadebe maka ntuliaka 2019.
Ebola
Ọrịa Ebola egbuola ihe karịrị mmadụ narị abụọ n'afọ a na mba DR Congo dịka ndịọrụ ahụike mba ahụ si kwuo.
Ebe foto si, Reuters
Ndị ọrụ ahụike DR Kongo ebidola ịgba ndị mmadụ ọgwụ mgbochi ịhụ ma ọ ga-ebelata ọnwụ site n'ebola
Ebola nke malitere ọzo n'ọnwa Julaị nke afọ a na-eme ya ugboro iri ọrịa a na-ewelite isi na mba ahụ kemgbe afọ 1976.
Ncheta agha mbaụwa nke mbụ
A na-eme emume ncheta agha mbaụwa nke mbụ nke Bekee kpọrọ "World War 1".
Ebe foto si, EPA
Emume a ndị mba Briten nakwa mba Frans na-eme nke a kpọrọ "Armistice Day", bụ iji cheta ndị lụrụ ọgụ na ya bụ agha.
Ndịisiala ọtụtụ mba agha a metụtara, gụnyere Donald Trump na Vladimir Putin nakwa Muhammadu Buhari na ihe ruru iri isii ndị ọzọ, so bịara Frans mgbaru maka emume a.
Ebe foto si, Getty Images
Na Folkstone, ebe ndị mmadụ gbakọrọ ịhụ eserese Wilfred Owen bụ ọma mbem agha
Na ya bụ emume, ndị mmadụ ga-ada nkịtị nkeji abụọ, iji kwanyere ndị nwụrụ n'agha ugwu.
Otu nwaanyị nwetara ohere mabanye aka n'ime ụgbọala bu Trump n'agbanyeghị ndị nchekwa gbara ya gburugburu.
"Operation Lafia Dole"
Ọnụ na-ekwuchitere ndị agha Naịjirịa bụ Texas Chukwu, ekwuola na ngalaba "Operation Lafia Dole" enwetala onyeisi ọhụrụ aha ya bụ Major General Benson Akinroluyo.
Nke a na-abịa ka e wegharịrị ndị agha gụnyere Major General Abba Dikko bụbụ onyeisi "Operation Lafia Dole".
Dikko ga-abụzi onyeisi ngalaba a kpọrọ "Civil Military Affairs".
Oshiomhole
Onyeisi otu pati APC bụ Adams Oshiomhole, ekwuola na enweghị nwụchi ọbụla ndị ọrụnchekwa DSS nwụchiri ya.
Ebe foto si, Getty Images
Adams Oshiomhole bidoro ọrụ dịka onyeisi otu APC n'ọnwa Juun, 2018
O kwuru na n'ezie ọ hụrụ ndị DSS otu ugboro, mana ọ bụ maka ịkpa nkata, na ọ bụghị nwụchi.
Ọkụ Kalifọnia
Oke ọkụ na-ere ere bidoro n'obodo Kalifọnia ụbọchị ole na ole ataala isi ihe ruru mmadụ iri abụọ na ise dịka ndị mba Amerịka si kwuo.
Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu,
Ndị otu Leicester City agbaghị aka ahịa ka ha zutere otu Burnley na be ha.
Ebe foto si, Getty Images
Kama, ha na ndị na-akwado ha mere ndị mmadụ echeta ebewe site n'etu ha si mee ncheta onye nwe ha nwụrụ n'ihe mberede ụgbọelu helịkọpta izu abụọ gara aga.
Akụkọ BBC Igbo na nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri
ndị ishi na-agụ egwu