I bi na Kaduna? Ị nwere ohere ịgagharị ugbua

Akụkọ dị mkpa taa

Ebuliela iwu na Kaduna

Image copyright Facebook/El-rufai

Kaduna steeti ebuliela iwu "onye apụla ezi" e tinyere na steeti ahụ kemgbe ụbọchị iri atọ na otu nke ọnwa Ọktoba.

Mana ndị bi na Kujama, Kasuwan Magani nakwa Kachia, ka nọ n'okpuru iwu a.

Achụtuola onyeisi ụlọomeiwu Anambara?

Akụkọ pụtara n'Anambara steeti na-ekwu na achụtuola onyeisi ụlọomeiwu ha bụ Rita Maduagwu n'oche ọchịchị.

Mana Maduagwu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụghị eziokwu, na ọ ka kwụ chịm dịka onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ.

Na mba ofesi,

Ihe ruru mmadụ asaa gụnyere otu onye mba Izrel anwụọla n'ime ọgụ na mgba malitere n'etiti ndị agha nnupụisi mba Izrel na Palestine, n'ime obodo Gaza.

Image copyright Reuters

Ọgu a malitere ubọchi ụka ka ndị Palestine chopụtara na ndị uweojii ndị Izrel na-eme nyocha na nzuzo n'ime Gaza.

N'egwuregwu,

Joe Cole gbabuuru mba Ịngland, otu Chelsea na West Ham bọọlụ, awụsala ọwa n'ihe gbasara asọmpi bọọlụ.

Image copyright Getty Images

Cole dị afo iri atọ na asaa ugbua, bidoro ịgba bọọlụ n'afọ iri na asaa ma soro Chelsea bulie iko ugboro ise.

Image copyright Getty Images

Ngalaba na-ahụ maka ọrịa na-efe efe ekwuola na ihe ruru mmadụ abụọ anwụọla site n'ọrịa Lasa Fiva.

Ha kwukwara na ọrịa ahụ efeela mmadụ mmadụ ise si na Edo, Ebonyi nakwa Ondo steeti.

Ọzọ,

Image copyright Hope Uzodinma/Facebook
Nkenke aha onyonyo Hope Uzodinma ji aha APC azọ ọkwa gọvanọ n'Imo Steeti na ntuliaka 2019

A na-atụ anya na Hope Uzodinma bụ onye anwụchiri ma tọghapụ n'ihi ahụike ga-awuchi n'ihu kọmitị na-ahụ maka nweghachi akụnaụba ọha taa.

Nke a na-abịa dịka ya na ha nwere nkwekọrịta na ọ ga-abịa zara ọnụ ya taa.

Na mba ofesi

Ụwa niile nọ n'iru ụjụ ugbua maka ọnwụ Stan Lee bụ otu n'ime ndị bidoro Marvel Comics nke na-eme ihe onyonyo nakwa akwụkwọ egwuregwu ụmụaka.

Ọrụ ndịọzọ eji mara Stan Lee gụnyere 'Captain America', 'Thor' nakwa 'Iron Man'.

N'egwuregwu

Image copyright @NGSuper_Falcons

Ndị otu Super Falcons nke Naịjirịa ejirila ọkpụ anọ dọọka neetị ndị otu Eleven Sisters de Gagnoa nke mba Cote d'Ivoire

Ha gbagburu ha n'asọmpị enyi na enyi ha nwere na mgbede Monde na Abidjan.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption'Onye anọghị ebe e so kee ihe, oke ya efuo' - Victor Umeh

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị