World Diabetes Day: Ọrịa shuga nakwa ụzọ ị ga-esi gbalahụ ya

Onye na-ele shuga dị n'ọbara ya

Ọrịa shuga bụ nnukwu nsogbu ahụike na-ata nchara n'ahụ nke na-egbu ihe karịrị otu nde mmadụ kwa afọ- o nweghị onye e nweghị ike ịrịa ya.

Ihe na-ebute ya bụ ahụ mmadụ enweghị ike igweri shuga dị n'ọbara (glucose).

Ọrịa shuga taa nchara n'ahụ, o nwere ike ibute ọrịa obi, mkpọnwụ ahụ, ikpu isi, mmebi akịrị (kidney failure) na ibe ụkwụ onye na-arịa ọrịa ahụ.

Nsogbu ọrịa shuga na-aga n'ihu - Dịka WHO siri kwuo, ihe ruru nde mmadụ 422 na-arịa ya n'ụwa niile- nke a bụ mmaaji anọ ndị na-arịa ya n'afọ 40 gara aga.

Na agbanyeghị ka o siri jọọ njọ, ọkara ndị na-arịa ya amaghị na ha na-arịa ọrịa shuga.

Mana mmadụ Igbanwe ka o si ebi ndụ nwere ike igbochi ọrịa a. Lee etu i nwere ike isi mee ya:

Gịnị na-ebute ọrịa shuga?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụdị ọrịa shuga a kpọrọ 'Type 1' na bekee na-ebido n'ụmụaka maọbụ ndị na-eto eto nwere ike isi n'ọbara maọbụ nje na-ebu ọrịa

Mgbe anyị riri nri mgbadoume (carbohydrate), ahụ anyị na-egweri ya ka ọghọ shuga.

Mmiri ahụ (hormone) nke a kpọrọ insulin na bekee nke a na-emepụta na anyịnya (pancreas) na-enye ahụ iwu ka ọ mịkọrọ shuga maka inye ike.

Ọrịa shuga na-abịa ma ọ bụrụ na ahụ anaghị emepụta 'insulin' maọbụ na ọ naghị arụ ọrụ nke nwere ike ime ka shuga dọrọ n'ime ọbara.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Shuga na-eme ka shuga dị n'ọbara gbalite

Kedụ ụdị ọrịa shuga?

E nwere ụdị ọrịa shuga dị iche iche.

Na nke a kpọrọ 'type 1', anyịnya na-akwụsị imepụta 'insulin', nke na-eme ka shuga gbalite n'ọbara.

Ndị ọkachara mara sayensị amaghị ihe na-ebute nke a mana ha kwenyere na o si n'ọbara maọbụ nje na-ebute ọrịa nke na-emebi ọwọ (cell) na-emepụta 'insulin'.

Ihe dịka pasent mmadụ iri nwere ọrịa shuga nke 'Type 1'.

N'ọrịa shuga nke 'type 2' , anyịnya anaghị emepụta 'insulin' zuru ezu maọbụ nke emepụtara anaghị arụ ọrụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mmiri ahụ(hormone) nke a kpọrọ insulin na bekee nke a na-emepụta na anyịnya(pancreas) na-enye ahụ iwu ka ọ mịkọrọ shuga maka inye ike

Nke a na-emekarị na ndị gbaliterela n'afọ, ndị na-eto eto, ndị buru ibu, ndị na-anọkarị na-emegharịghị ahụ, nakwa ndị si mba ndịda Asia na-enwekwa ya.

Ụmụnwaanyị dị ime nwekwara ike ịria ọrịa shuga nwaanyị dị ime( gestational diabetes) ma ọ bụrụ na ahụ ha enweghị ike imepụta insulin ga-ezuru ha na nwa ha.

Ọtụtụ nchọpụta na-ekwu na ihe dịka pasent 6 rue 16 ụmụnwaanyị dị ime ga-enwe ọrịa shuga.

Ọ dị mkpa ka ha lebe anya n'ihe ha na-eri, na-emegharị ahụ iji gbochie ọrịa shuaga type 2.

Mmadụ nwekwara ike inwe ọnọdu na akwado ịbanye ọrịa shuga- ọnọdụ shuga dị n'ọbaara igbalite elu nke nwere ike ịdaba n'ọrịa shuga.

Kedụ njịrịmara ọrịa shuga?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ike ọgwụgwụ,oke agụmmirị an oke ịnyụ mmiri

Njirimara ọrịa shuga gụnyere:

  • Oke agụụ mmiri
  • Oke ịnyụ mamịrị ọkachasị n'abalị
  • Oke ike ọgwụgwụ
  • Ịta ahụ akwadọghị akwado
  • Ọrịa ọnya adịghị ala ala n'onụ
  • A hụchaghị ụzọ nke ọma
  • Ọnya isi ịke ọlịla

Ụdị ọrịa shuga dị iche iche

Dịka ngalaba ahụike mba Birten a kpọrọ British National Health Service, njirimara ọrịa shuga 'type 1' na-esosị onwe ya ọsọ ọsọ n'ụmụaka na ndị na-eto eto.

Ndị nke 'type 2 na enyekarị nsogbu bụ ndị karịrị afọ 40 (maọbị ndị sị ndịda Asia ruru afọ 25); ndị ndị mụrụ ha maọbụ nwanne ha nwere ọrịa shuga; ndị buru oke ibu; nakwa ndị sị China, na ndị isiojii.

E nwere m ike igbochi ọrịa shuga?

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Were mkpụrụosisi, mkpụrụ nrị na mmanụ ndị na-adị mma n'ahụ dozie oke shuga

Nke mbụ, gbaara nri na mmanya nwere shuga ọsọ.

Kama achịcha ọcha(white bread), na-eri nrị zuru oke.

Shuga na nri eghere eghe ezụghị oke inye ezi ihe n'ahụ n'ihi na akwara(fibre) nakwa vitamin dị na ha emebiela.

Iji maa atụ: Hapụ achịcha ọcha(white bread),eghere eghe osikapa ọcha, mmanya ọtọbịrịbịrị, ịhe ọṅụṅụ ụtụtụ ( breakfast cereals) nwere shuga.

Kama hara nrị nwere akwụkwọ nrị, mkpụrụosisi, agwa na mkpụrụ nrị zuru oke.

Ezi nrị ndị ọzọ gụnyere dịka mkpụrụ kashu, ọpapa, nakwa azụ nwere mmanụ omega-3 dịka azụ nwankata, azụ ahụekere (markerel)

Ọ dị mkpa irichi nrị anya mana erifele afọ.

Mmegharị ahụ dị mkpa na-ewetu shuga dị n'ọbara.

National Health System (NHS) na-enye ndụmọdụ ka a na-enwe mmegharịa ahụ dịka ịgasi ije ike, ịrị ụlọelu, na egwuregwu ndị ọzọ awa abụọ na ọkara kwa izuụka.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọ dị mkpa ka mmadụ na emegharị ahụ awa abụọ na ọkara izu ụka ọbụla.

Isiokwu Ndị Emetụtara