2019 Elections: Ọ bịbịa Atiku abụghị maka anyị - Ndị ntoroọbịa Igbo

Akụkọ dị mkpa

Atiku gara Enugwu

Ben Nwabueze na Atiku Image copyright @atiku

Ụfọdụ ndị Igbo ekwuwela uche ha gbasara ọgbakọ Atiku na ndị isi ha mere n'Enugwu n'ụbọchị November 14,2018.

Onye ndu ndị ntoroọbịa ohaneze ndị Igbo bụ Kingsley Dozie kwuru na Atiku na-akọrọ onwe ya na ndị ọ ma na ọ bụghị ndị ntoroọbịa Igbo ka ọ bịakwutere.

O kwukwara na ndị ntoroọbịa Igbo agaghị atụnyere Atiku maka na o bughi ha n'obi.

Ụfọdụ ndị isi ala Igbo kpọrọ ọgbakọ ha "mkpoko Igbo" ekwetala maka mpụta Atiku Abubakar na Peter Obi dịka ndị ga-azọ oche onyeisiala na ntuliaka 2019.

Ha kwukwara na mmekpa ahụ ndị Igbo akarịala ya kpatara na ọ bụ naanị mgbe Atiku/Obi chịwara ka ha nwere olileanya na ọnọdụ a ga-agbanwe.

Ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo biara ya bụ ọgbakọ gụnyere Obi nke Onicha bụ Igwe Nnaemeka Achebe, onyeisi ohaneze ndịgbo bụ Nnia Nwodo, sinatọ Enyinnaya Abaribe na ndị ọzọ.

Onye gụpụtara nkwekọrịta ha bụ Olisa Agbakọba kwuru na ihe mere ha ji kweta na Atiku na Peter ga-azọ ọkwa onyeisiala bụ maka nhazigharị Naịjirịa ha kwuru ha ga-eme ma ha banye n'ọkwa.

Ha kwetara na mpụta Atiku na Obi ga-eme ka ndị Igbo nwee ọnụ n'ihe na-eme n'etiti gọọmenti Naịjirịa.

Ọkammụta Nwabueze rịọrịọ ndị Igbo ka ha kwadọ mpụta Atiku na Obi ma tụnyere ha n'igwe ka ha merie na ntuliaka na-abịanụ.

O kwuru otu ihe ọ chọrọ ime tupu ọnwụọ bụ ihụ na ndigbo so n'ihe a na-eme na gọọmenti etiti.

Nwabueze kwuru na ọ gaghị ezu ike maọbụrụ na ndigbo esonyeghi n'ihe a na-eme na Naịjirịa ma rịọkwa ndị ọchịchị ala Igbo ka ha were otu obi na-eme ihe.

Cheta na onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abububar gara Enugwu ebe ya na ndị isi ụfọdụ ndị ndu Igbo nwerr nzukọ.

Akụkọ kwuburu na obi adịghi ụfọdụ ndị na-achi Igbo mma maka etu o siri họpụta Peter Obi dịka onye ga-abụrụ ya osote onyeisiala ma o merie ntuliaka 2019.

Ụfọdụ gọvanọ na ndị eze ama ama nọ na nzụkọ ahụ.

Osita Chidoka, bụbu minista na-ahụ maka njem ụgbọelu dere maka nzụkọ a n'akara Twitter ya.

Akụkọ ka na-abịa

Ọzọ,

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kanu na-efu kamgbe Sepụtemba afọ 2017

Ụlọikpe ukwu di n'Abuja agwaala Sịnetọ Eyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ọzọ gbara Nnamdi Kanu aka ebe ha kwụọ otu nde narị naira.

Ọkaikpe Nyako nyere iwu a iji megharị usoro oji hanye Nnamdi Kanu n'aka Abaribe n'afọ 2017.

Na mba ofesi

Image copyright Reuters

Minista na-ahụ maka nchekwa na mba Izrel bụ Avigdor Lieberman agbaala arụkwaghị m.

O mere nke a n'ihi nkwekọrịta ndị gọọmentị etiti mba ahụ nwere iji kwụsị ọgụ n'etiti ha ndị Palestine n'abalị abụọ na Gaza.

N'egwuregwu

Otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjirịa esila Abidjan gaba Accra na njem ịbulata iko mba Afrịka nke ụmụ nwaanyị.

Ha kwuputara nke a site n'akara twitter ha.

Gee nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ite ime na-arị elu

Image copyright Getty Images

Nchọpụta e mere maka atụmatụ ezinaụlọ a kpọrọ 2018 Global Family Planning kwuru na ime e tepụrụla na Naịjirịa n'afọ 2018 eruola otu nde na ọma(1.3m.), ebe ndị tere ime azụụlọ dị 735,000.

E wepụtara akụkọ a n'ọgbakọ atụmatụ ezinaụlọ bụ International Conference on Family Planning bụ nke na-eme na mba Rwanda ugbua.

INEC Ebonyi Steeti na-arịọ ndị mmadụ arịrịọ

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Inec: Bia nara PVC gị

Dịka ọ fọdụrụ naanị abalị otu narị ka e mee ntuliaka afọ 2019, ụlọọrụ INEC nke Ebonyi Steeti etiela mkpu na ọtụtụ ndị mmadụ a bịabeghi were akwụkwọ ntuliaka ha.

Onyeisi ụlọọrụ ahụ na Ebonyi Steeti bụ Godswill Obioma kwuru na ihe karịrị otu puku akwụkwọ ntuliaka ka nọ n'aka ha ugbua.

N'ofesi

Image copyright Reuters

Ndị na-agbanyụ ọkụ na kalifonịa ekwuola na mmadụ iri anọ na asatọ anwụọla ebe ọtụtụ na-efu efu n'ihi ọkụ ọgbụgba a.

Ndị ọrụ a kwuru na ha ejikọtala ọkụ na-agba n'obodo ahụ ka ọ ghara ifesasị mana ha agaghị emeli nke ruo otu ọnwa.

N'egwuregwu

Image copyright AFP

Ọtụtụ ndị mmadụ gbakọtara na Mexico n'emume mmalite asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị na-enweghi ụlọ nke agba iri na isii ya.

Ihe a bụ asọmpị e hiwere n'afọ iri abụọ gara aga, iji kwalite ndụ ndị na onweghi ka ọha bụrụ ha n'ụwa.

Nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji

Ihe nkiri:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionApprenticeship scheme: Etu Igbo si jiri ịgba bọyị enyere onwe ha aka