Nnamdi Kanu: Liverpool, Iri ji, egwu Phyno na ihe ndị ọzọ na-amasị ya ị maghị

Phyno na Kanu Image copyright Getty Images na @phynofino
Nkenke aha onyonyo Onye mara na Kanu mara agba udi egwu a?

Ọtụtụ ndị mmadụ mara na Nnamdi Kanu bụ onye Isiama Afara, dị na Umuahia, isi obodo Abia Steeti.

Ha makwara na ọ bụ site afọ 2011 ka Nnamdi Kanu malitere dịka onye bụ onyeisi ndị otu chọrọ ịnwere onwe ha nke akpọrọ Indigenous People of Biafra (Ipob).

Mana n'ime akụkọ a, ị ga-achọpụta ihe ise ndị ọzọ na-amasị Nnamdi Kanu ọtụtụ mmadụ amaghị maka ya.

1) Ofe Ụgbọgụrụ

Image copyright @ntanta.delicacies

Nwanne ya bụ Emmanuel Kanu gwara BBC Igbo na ofe a na-atọpụ Kanu isi.

O kwuru na: "Nni olulo na-adị ya mma ebe dị ukwuu. O na-eji ya eri ofe akwụkwọ nke eji ụgụ na ọkọrọ na-esi, nke a na-etinye ụkpaka n'ime ya"

2) Phyno

Image copyright @phynofino

BBC Igbo chọpụtara na Nnamdi Kanu hụrụ egwu Phyno n'anya nke ukwu.

Emmanuel kwuru na egwu ndị ọzọ ha tiri n'oge garaaga wuru ewu dịka egwu Osadebe na Oriental Brothers bụkwa ihe na-amasị Kanu nke ukwu.

3) Liverpool

Image copyright Getty Images

Emmanuel tiri mkpu aṅụrị oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ nke a.

O kwuru na: "Ọ naghị ekwete iri nri ọbụla maọbụrụ na otu Liverpool na-agba asọmpị ọbụla makana egwuregwu bọọlụ bụ ihe na-amasị ya nke uwku"

4) Nnamdi Kanu na-ekpu mmanwụ

Nnanne ya gwara BBC Igbo na Kanu na-ekpu mmanwụ akpọrọ Ekpo ha na-akpọ Eko.

N'ọnụ okwu ya: "N'oge iri ji ọhụrụ, Kanụ na-ekpu mmanwụ akpọrọ Oke Isiekpe."

Ọ gara n'ihu kwuo na Kanu so na ndị wetere Ekpe n'ime obodo ha.

5) Uwe ndị obodo Idoma

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Kanu na uwe ndị Idoma

Emmanuel kọwara na Kanu nwere nkwenye siri ezigbo ike na ya na ndị Idoma bụ otu.

O kwukwara na Kanu nwere ọtụtụ akwa ọcha na-amasị ya nke ukwu.

Emmanuel kwuru na: "Kanu were uwe ndị a makana o nwere nkwenye na Igbo niile bụ otu".

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a