My Transition Hours: Ihe atọ dị mkpa dị n'akwụkwọ ọhụrụ Jonathan dere

Goodluck Jonathan Image copyright Getty Images

Aka chịburu Naijiria bụ Goodluck Jonathan ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ na-ata ya ụta ihe mere o jiri nyefe ọkwa ọchịchị na 2015 karịa ịzọ ya n'ụlọ ikpe.

O kwuru n'ọgbakọ ebe o wepụtara akwụkwọ ọhụrụ o dere nke ọ kpọrọ "Transition Hour" "E nwere ọtụtụ ihe ejiri megide m. Ihe dịka Boko Haram na ụmụaka Chibok."

1. Jonathan kwuru na Obama megidere ya na ntuliaka 2015.

" Obama wepụtara ihe onyonyo ọ nọrọ kpọọ ndị Naijiria oku gwa ha etu ha ga-esi tu vootu dịka ọ gwara ha ka ha jiri vootu ha bido 'agba ọhụrụ ma wepụ gọọmjenti n'achịnụ'."

2. O kwuru na ọdachi ụmụaka Chibok dịka nkata a kpara megide ya.

"Ebee ka ndị isi ụlọakwụkwọ, ndị ọrụ nchekwa, ndị nkuzi na onyeisi ụlọakwụkwọ Chibok nọ mgbe ihe na-eme?

"Ọ dị nọọ ka ihe a kpara ya akpa dịka ngaghariiwe sochiri ya n'akụkụ ala anyị. Ndị niile dika ndị ndọrọndọrọ ọchịchị tinyere aka were ọdachi ahụ mere ihe ndọọndọọ ọchịchị." Ekwenyere m n'otu ụbọchị, ndị ọkacharamara n'ihe gbasara nchekwa na ndị sonyere n'ịchọ na ịzọpụta ụmụaka ahụ ga-agwa ụwa eziokwu ihe mere na ntọrị ụmụaka Chibok."

3. Ọ kpọrọ Inec oku ka ha gbaa mbọ inye aka kwụsị oke izu vootu nke na ari elu ugbua dịka ana akwado ntuliaka 2019.

"Nsogbu izu vootu akarịala na Naijiria. Ebe mba ndị ọzọ machịri ya , na Naijiria ọghọla omenala. Nke a adịghị mma.

" Ana m atu alo ka anyị lebanye anya n'etu anyị sị arụ ọdọ ntuliaka (polling booth) ṅomie mba ndị ọzọ jị ụlọ ndị gọọmenti ha eme ya."

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a