2nd Niger Bridge: Rụchaanụ akwa mmiri n'oge - Ụlọomeiwu

Akwa Naija
Nkenke aha onyonyo Ọrụ Akwa Naịja nke abụọ ka nọ n'isi mbido

Njem ndị kọmiti ụlọ omeiwu Naịjirịa nke ihe gbasara nyocha ka esi arụ ọrụ n'okporo ụzọ gọọmentị etiti amalitela ọrụ ha n'Enugwu.

Onyeisi ya bụ kọmiti si na n'ụlọ omeiwu bụ onye na anọchite anya Oji River, Aninri na Awgu, bụ Toby Okechukwu.

Maazi Okechukwu du ndị otu ya wee malite njem nleta n'Enugwu wee sị ya banye Anambra steeti.

Ọrụ na-aga n'ihu kọmiti ahụ lelegasịrị gunyere: Akwa mmiri Trans Ekulu dị n'Enugwu, ụzọ awara awara si 9th Mile Corner wee gaba Orokam n'Ugwu Hausa.

Nkenke aha onyonyo Ndị nọ ọrụ n'okporoụzọ Enugwu-Ọnịcha ebe ọ gafere Ezeagụ dị n'Enugwu steeti.

Ya bụ ụzọ 9th mile-Orokam bụ nke dị 72km ma bụrụkwa okporo ụzọ abụo dịkọrọ ọnụ (dual cartiage way) ka aga arụ ya.

Ego ole ọga ewe ndị RCC ịrụ ya bụ ụzọ bụ ijeri naira iri atọ na isii (36 billion naira).

Ha sị na ya bụ ụzọ bata n'ụzọ awara awara sị Enugwu ga Onicha ebe ọbụkwa RCC ji ya bụ ọrụ ngo.

Toby okechukwu na ndị otu ya kwụsịkwara ma lele ka ọrụ sị aga na Ezeagu na Oji River.

Nkenke aha onyonyo Foto a na-egosi maapụ ebe a na-arụ ụzọ nakwa ụlọọrụ ndị na-arụ ya

Ebe ọzọ ha gbara ụkwụ na njem nleta ha bụ na Ụmụnya ebe okporo ụzọ Enugwu-Onitsha jọrọ nnukwu njọ.

Toby okechukwu nọrọ na ya bụ ajọ ụzọ Umunya were kwuo hoo haa na Obi adịghị ya na ndị kọmiti ya mma n'ihi na ọrụ anaghị aga dịka okwesiri na ebe niile ha hụrụ.

Ọ siri na ọtụtụ ndị etinyere ya bụ ọrụ n'aka kwuru na gọọmenti etiti akwuzubeghị ha ego ọrụ, nke a mere ọrụ adịghị aga ọsọ ọsọ etu okwesiri.

Okechukwu kwuru na nnukwu ọrụ dịrị ha ma ha laruo Abuja n'ihi na ha ga-aga chọpụta ihe mere na akwuzubeghị onye ọrụ ngo ọbụla ego ọrụ ya.

Nkenke aha onyonyo Ebe a bụ ụzọ Ugwuoba na mpaghara Oji River

Okwuru na kọmiti ya agwala ndị niile jị ọrụ ụzọ n'Enugwu-Ọnịcha ka ha gbaa mbọ rụchaa ya tupu ekeresimesi erue mgbe ndị mmadụ na alọta ụlọ.

Kọmiti ahụ sizi na ụmụnya wee gawa Ọnịcha iga hụrụ ebe ụlọọrụ Julius Berger malitere ịrụ akwa mmiri Naịja nke abụọ (2nd Niger Bridge).

Ndị ọrụ ahụ gosikwara Kọmiti ahụ bịara nleta ebe ha malite ịwụ kọnkịrị nakwa okporo igwe ha ga-ejị banye na mmiri rụpụta ụzọ ọhụrụ.

Okechukwu gwara ndị ji ọrụ 2nd Niger Bridge ahụ ka ha gbaa mbọ rụchaa ya bụ akwa mmiri oge ha na gọọmentị kwekọrịtara.

Isiokwu Ndị Emetụtara