Gọvanọ ọwụwa-anyanwụ gara hụ Onyeisiala Buhari

Ọwụwa anyanwaụ Image copyright Presidency/Twitter
Nkenke aha onyonyo Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

Ụbọchị Nọvemba 21, 2018, ka gọvanọ ndị ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa zukọrọ n'Abuja ịhụ Onyeisiala Muhammadu Buhari n'obi ya.

Ndị gara ya bụ ọgbakọ ime ụlọ gụnyere Gọvanọ Abia, Enugwu nke Ebonyi, nakwa osote onyeisi ụlọomeiwu bụ Ike Ekweremadu.

Mgbe ha mechere ya bụ ọgbakọ, onyeisi ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ bụ Dave Umahi, gwara ndị ntaakụkọ na ha gara ikele Onyeisiala Buhari maka ọrụ ọma ya n'ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa.

Ọ sịkwa na isi ije ha bụkwa ịrịọ onyeisiala ka o tinyekwuo ego n'ọrụ n'ọwụwa-anyanwụ.

N'olu ya, Umahi kwuru, "anyị bịara ikele Onyeisiala maka mbọ ya gbarasa akwammiri Naịja nke abụọ (Second Niger Bridge) bụ nke Julius Berger na-arụ n'ọnụ ego dị ijeri narị abụọ na isii (206bn) bụ nke enyegoro ha ijeri asaa (7bn).

Anyị bịara ịrịọ Onyeisiala ka o jisiike nyezuo Julius Berger ọkara ya bụ ego ọrụ ka anyị wee mara na gọọmenti akwadola ya bụ mgba n'ezie."

Mgbe ajụrụ ya maka ntuliaka 2019, Umahị zara na onweghị ihe ha kpara gbasara nke a.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a