Southeast Railway: Senate kpọrọ Amaechi oku maka ụgbọoloko n'Alaigbo

Rotimi Amechi Image copyright Ministry of Transport
Nkenke aha onyonyo Rotimi Amechi minista na ahụ maka njem

Ụlọomeiwu ukwu akpọọla Minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechị ka ọ bịa kọọwara kọmiti na-ahụ maka ego mgbazinye na ụgwọ eji ndị mba ọzo ihe kpatara ụgbọoloko ga-eji na-akwụ ụtụisi n'okpọrọ ụzọ ụgbọ si Pọtakọtụ gawa Medugri.

Achọpụtara na-ọnọdụ nkwekọrịta eji abado ọrụ ịrụzị ụzọ ụgbọoloko n'ọwụwa anyanwụ abụghị otu na ka esi arụ ebe ndị ọzo na Naịjirịa.

Eji ego mgbazi sị mba China arụ ụzọ ụgbọoloko ndị ọzọ na Naịjirịa.

Ụlọomeiwu ukwụ nyere ikike ka enwere ego mgbazita ndị China were rụzie ụzọ ụgbọoloko, mana ndị omeiwu chọpụtara na Muhammadu Buhari si ụzọ ọzọ arụ nke ndị ọwụwa anyanwụ, dị ka akwụkwọ ndị ntaakụkọ Guardian akụkọ The Guardian siri dee.

Akwụkwọ akụkọ dere na ọrụ ngo nke a bụ nke Bekee kpọrọ Public Private Partnership (PPP).

Nke a pụtara na ndị China bụ ndị wetere ego eji bado ya bụ ọrụ ga-akpọrọ isi ego ha mgbe ụgbọ gbawara.

Ọ bụ Sinatọ Ekweremadụ bụ onye nọchite anya Enugwu West bụ onye tụpụtara alo a.

Mgbe ọ na-ekwu okwụ a, Ekweremadụ chetere na ọteela aka ya bidoro mawa ya bụ ọkwa n'ụzọ esi abado ọrụ imezi ụzọ oloko na mpaghara ọwụwa anyanwụ akwụchaghị ọtụ.

Image copyright Fed. Ministry of Transportation
Nkenke aha onyonyo Ụzọ ụgbọoloko

Ụzọ oloko Ekweremadu mara ọkwaa gụnyere Port Harcourt - Enugu - Markudi nakwa Yola na Maduguri gawara Delta, Plateau nakwa ụzọ Nasarawa steeti.

Ngbe okwuru ihe a, ihe asara ya bụ na ndị Gnereal Electric (GE) ga-eweghara mpaghara ahụ.

Mana ndị omeiwu a chetere na nkwekọrịta GE na ndị gọọmenti mara afọ n'ala nke mere GE jiri gbaa arụkwaghịm.

Ekweremadụ chetere na ya bụ ọrụ ngọ nke ụzọ Legọs gawa Kano nke ọwụwa anyanwụ natakọtara ikike n'ụlọ omeiwu otu mgbe, "Mana ugbua egwu ọkụkọ ahụla Igbo puo eze", dịka Ekweremadụ siri kwuo.

Ekweremadu kwuru na "ugbua, ihe asizi ndị China mee bụ ha were ego ha rụọ ya bụ ụzọ ụgbọoloko ma kpọrọ ego ha mgbe ụgbọ gbawara."

Ọ sị na mba ọbụla na-eme ụdi ihe a agaghị anyandụ.

Mbọ niile BBC gbara ịnwete ndị ọrụ ngalaba na-ahụ maka njem maka ịzara ọnụ ha nara na-iyi.

Akụkọ ga-amasị gị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUche Nwosu kwuru na ọ bụ ya ka ga-anọchite anya APC n'Imo steeti

Isiokwu Ndị Emetụtara