Nnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu

Ndọrọndọrọ
Nkenke aha onyonyo Joe Igbokwe na Nnia Nwodo

N'ọba ozi Twitter ha, otu pati PDP ekwuola na ndị Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa apụghị ịtụnyere Onyeisiala Muhammadụ Buharị akwụkwọ na ntụlịaka 2019.

PDP kwụrụ n'ihe ha jiri kwesie ike na nke a bụ maka na ọnweghị nkwa niile PDP kwere ndị Igbo ha mejuputara.

Ha sị na obi malitere ịmapụ onyeisiala Muhammadu Buhari kemgbe ndị ọwụwa anyanwụ natabatachara onye bu ọkọrotọ PDP na ndọrọdọrọ ọchịchị 2019 bụ Atiku Abubakar n'uju maka ọrụ ọma, ugwu na nyekwa Okeke na Okafo oke ruru ha.

PDP kwuru na mbọ niile Muhammadu Buhari na-agba ihụ na ndị ọwụwa anyanwụ kwadoro ya nara n'iyi maka na ha ahụla na ọ bụ okwe nkwa eme eme.

N'aka ọzọ, ọnụ na-ekwuchitere APC na Legọs steeti bụ Joe Igbokwe ekwuola na Igbo anabataghị APC bụ ezigbo asị.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu

Ọ sị na njem nleta ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ gara na nke Onyeisiala Muhammadu Buhari nsonso a gosiri ezi nnabata.

Ọ gbarụkwara ihu kwuo na "Ohaneze Ndigbo bụ ndị ọ sị nabatara PDP naara ego iji mee nke a".

Ọ sị na ihere n'eme ya maka na ndị Igbo amaghị ndọrọndọrọ ọchịchị, na ọbụrụ na Igbo bijọọ aka na ntuliaka a na-abịa n'ihere ga-eme ha.

BBC kpọtụkwara Onye ndu Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo ị nụrụ onu ya maka ebubo a Joe Igbokwe boro ya.

Nnia Nwodo zara na Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNnia Nwodo - Joe Igbokwe amaghị ihe ọ na-ekwu

"Nke mbụ. Ohaneze ọ nabatara Atiku? Ọ bụ ndị ọnụ na-eru na-okwu n'Igbo nke onye ndụ ha bụ Ben Nwabuze kpọrọ m oku mgbe Atiku bịara.

Ọ bụghị Ohaneze kpọrọ ya bụ ọgbakọ. Ọ bụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2019 ka Ohaneze ga-ezukọ ịkwụ onye anyị ga-akwado na ntụlịaka 2019."

Osị na obi ndị ndị Igbo ụtụ na-ewepụtara onye igbo na ọnọdụ enwepụtara Peter Obi.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara