Boko Haram: Ndị chegharịrị abụrụra ndị ahapụru ka ha banye obodo

Akụkọ dị mkpa:

Gọọmenti Naịjirịa ga-atụhapu ndi Boko Haram

Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndi Boko Haram si na ha achọghịzị ịnụ ọgụụ

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ndị Boko Haram karịrị mmadụ otu nari na iri ise ga-enwere onwe ha ka a "sachachara ha ajọ ihe niile dị ha n'isi".

Ndị a mere ihe Bekee kpọrọ "de-radicalisation programme" nke ha nọ n'ime ya ruo ọnwa iri na otu na Gombe steeti.

Gọọmentị Naịjirịa agbagharala ndị Boko Haram a, ka ha n'owe ha kwere nkwa na ha echeghariala

Njem nyocha ọrụ gọọmenti n'ọwụwa anyanwụ ka na-aga n'ihu

Nkenke aha onyonyo Ndị Komịti na-ahụ maka ọrụ kwuburu na obi adighị ha mma ka ha gachara ụzọ Enugwu-ọnịcha ụnyaahụ

Ndị omeiwu na-etinye anya n'ọrụ ka nọkwa njem nyocha ọrụ gọọmentị na-arụ na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Cheta na ha gara gbaa anya n'ụzọ si Enugwu gawa Ọnịcha na Akwa Naịja nke abụọ ụnyaahụ.

Taata ha gara lete ụzọ n'Isiagu nke dị n'Ebonyi steeti nakwa Nnenwe dị n'Enugwu steeti.

N'Ofesi

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndi nụrụ agha eji napụ ndiọcha ọchịchi na Zimbabwe nọ n'isi inara ndị ọcha ala

Mba Zimbabwe ekwerela na ọ ga ewezụga dọla nde itoolu na iri asaatọ na itoolu maka ịji ticha ndị ọcha anara ala n'ike na mba ahu obi.

Cheta na n'ime ọchịchị onyeisiala Robert Mugabe ndị mmadụ chụpụrụ ụfọdụ ndị ọcha n'ụgbọ ha makana ha sị na ọ bụbụ ala nna ha a nara ha n'ike.

N'Egwuregwu

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mikel bụ onye ndụ ndi Super Eagles ugbua

Onye nkuzi ndị Super Eagles bụ Gernot Rohr ekwuola na Mikel Obi ka nwere ohere ịsọrọ Naịjirịa mpị na iko mba Afrịka nke 2019.

Cheta na Mikel esoghi n'ime ndị sọọrọ mpị na Sawt Afrika eji chụta nta ịga Iko mba Afrika ahụ.

Image copyright Twitter/Super_falcons

N'egwuregwu,

Otu Super Falcons menyere ndị Naịjirịa obi aṅụrị ka ha ji ọkpụ goolu anọ merie Zambia oge ha zutere n'asọmpi Iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị.

Fransisca Ordega nwetara ihe nrite "onye kachasị gbaa" n'egwuregwu ahụ.

Mmeri a bụ nke mbụ Ndị "Falcons" na-enweta n'asọmpi a dịka Ghana meriri ha na nke mbụ ha gbara.

Ebe Didier Drogba gbabuuru Ivory Coast nakwa Chelsea na Galatasaray bọọlụ awụsala ọwa kpam kpam n'egwu ọ gbara afọ iri abụọ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Didier Drogba buliri iko Premier League anọ, iko FA anọ, Iko League atọ na otu iko Champions League oge ọ nọ Chelsea

Ihe Uche Nwosu kwuru

Onye na-ele anya ịzọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti bụ Uche Nwosu, kwuru na ọ bụ ndị ụlọikpe Naịjirịa ka ọ dị n'aka ikwu onye ga-anọchite anya APC.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUche Nwosu kwuru na ọ bụ ya ka ga-anọchite anya APC n'Imo steeti

O kwukwara na tupu e ruo ngwụcha Nọvemba mgbe a ga-amalite ịchụ nta vootu n'ime obodo, na ha ga-ama ihe iwu obodo ga-ekwu maka onye ga- anọchite anya APC Imo steeti.

Amaechi bịa zara ọnụ ya

Ndị ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa akpọọla minista na-ahụ maka njem bụ Rotimi Amaechi ka ọ bịa zara ọnụ ya gbasara ụzọ ụgbọ oloko dị n'Enugwu na Pọt Hakọt.

Image copyright Getty Images

Ike Ekweremadu bụ osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu kwuru ka Amaechi bịa kọwaara ha atụmatụ gọọmentị etiti nwere maka ịrụ ya bụ ụzọ ha kwere na nkwa.

Na mba ofesi,

James Mattis bụ odeakwụkwọ na-ahụ maka nchekwa ndị mba Amerịka, ekwuola na ndị agha uweojii ezipụrụ ka ha na-echekwa oke ala jikọrọ ha na Mekziko agaghị ebu egbe maọbụ ngwaagha ọbụla.

Image copyright Reuters

O kwukwara na ha agahị enwekwa ikike ịnwụchi mmadụ, na ọrụ ha bụ ikpuchite ndị na-arụ n'oke ala ahụ ka ihe ọjọọ ghara ime ha.

Gere akụkọ BBC na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Ihe nkiri

Sadio Mane na-agbara Liverpool bọọlụ, dị afọ iri abụọ na isii, gbakwara asọmpi niile Senegal gbara n'Iko Mbaụwa.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC African Footballer of the Year 2018: Mane so na ndị a họrọ