APC Imo: E duhiere ọkaikpe Orjiakor ụzọ - FCC Jones

Eze Madumere na Rochas Okorocha Image copyright Getty Images/Facebook Madumere

Ọnụ na-ekwuchitere pati All Progressives Congress (APC) n'Imo steetị bụ FCC Jones Onwuasoanya, ekwuola na edughiere ọkaikpe kpere ikpe Eze Madumere na APC.

N'ozi Onwuasoanya kesara, o kwuru na nkagbu Ọkaikpe Kemakolam Orjiakor, kagburu ntuliaka imeụlọ ndị APC mere n'Imo steeti ụbọchị Oktoba 6, 2018, bụ na njehie.

Onwuasoanya kwuru nke a ka ụlọikpe ukwu dị n'Imo steeti kpebiri na e mere ntuliaka imeụlọ gara n'anya ọma n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba nke ọ bụ Hope Uzodimma meriri na ya bụ ntuliaka.

N'okwu ya, o kwukwara na Ọkaikpe Orjiakor kpebiri ikpe ya site n'ihe ọkaiwu nke Madumere bụ osote gọvanọ steeti ahụ gwara ya mee; nke bụ na ya ejila ntuliaka imeụlọ APC ọzọ e mere kpọrọ ihe, karịa nke ọ sị na e mere ụbọchị mbụ nke Ọktoba.

O bokwara ndị ọ kpọrọ "ndị omekome chọrọ imebi pati" ebubo na ha kpọtara ọkaiwu bịara tụọ asị, kwuo na e mere ntuliaka imeụlọ ụbọchị mbụ nke Ọktoba ahụ, nke mere Ọkaikpe Orjiakor ji kagbuo ma kpebie na enweghị ntuliaka e mere ụbọchị nke isii n'ọnwa ahụ.

Nkenke aha onyonyo FCC Jones bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị APC n'Imo steeti

Onwuoasoanya kwuru na onyeisi pati ha emeghị ihe iwu pati ha kwuru, nke bụ na "naanị onyeisi ndụmọdụ n'ihe gbasara iwu nwereike ịhọpụta ọkaiwu ndị ga-anọchite anya pati ha ma a kpụpụ pati ha ụlọikpe.

Kama ime nke ahụ, onyeisi pati ha gara n'ihu napụ onyeisi ndụmọdụ ahụ ikike o nwere ma were aka ya họpụta ọkaiwu, na-agwaghị ya agwa."

Onwuasoanya gakwara n'ihu kwuo ka ndị mmadụ cheta na ụbọchị abụọ nke Ọktoba, na Adams Oshiomhole bụ onyeisi APC, kwuru n'ihu ọha na o kposasịrị kọmiti Gulak, ma kwuo na a ga-ehibe kọmiti ọzọ.

O kwuru na ihe ọ pụtara bụ na akwụkwọ a gbara ha bụ echiche e chefọrọ echefọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionUche Nwosu kwuru na ọ bụ ya ka ga-anọchite anya APC n'Imo steeti

Onwuasoanya kwuru na emeghị ntuliaka imeụlọ n'Imo steeti ụbọchị mbụ n'Ọktoba 2018, kama na e mere ya n'ụbọchị nke isi, ebe Uche Nwosu meriri ma bụrụ onye ga-efe ọkọrọtọ APC na steeti ahụ, dịka ọkaiwu Henry Idahagbon bụ odeakwụkwọ nke kọmiti na-ahụ maka ntuliaka imeụlọ nke ndị gọvanọ, si kpọpụta.

O kwukwara na pati ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị, ebe ha ga-echebiri ikpe ziri ezi.

BBC gbara mbọ iweta Madumere maọbụ ọnụ na-ekwuchitere ya mana ha azaghi ekwenti ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: