Port Harcourt: Lee ka esi zọpụta ndị tọrọ n'ụlọ elu dara ada

Akụkọ dị mkpa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionPort Harcourt: Lee ka esi zọpụta ndị tọrọ n'ụlọ elu dara ada

Ndị ọrụ gbata gbata azọpụtala mmadụ ise n'ụlọ elu dara na Port Harcourt.

Otu onye n'ime ha pụtara na ndụ gwara BBC na ya enweghị ego o ji aga ụlọ ọgwụ maka ọgwụgwọ.

Image copyright RIVERS STATE GOVT HOUSE
Nkenke aha onyonyo Otu onye pụtara n'ụlọ a adara ada na ndụ

Ezinaụlọ ndị nke ha so n'ụlọ dara ada ekwuola na onye nke ha ka tọrọ n'ime ụlọ ahụ dara na Port Harcourt.

Ndị ọrụ gbata gbata kwuru na otu onye anwụọla mana ha gbapụtara mmadụ iri abụọ na abụọ wee zọpụtakwa otu nwoke aka ya bepuru ebepu na ya bụ ihe mberede.

Cheta na ụlọ elu nwere mpaghara asaa a ka na-arụ arụ dara ada na mgbede ọnwa November, nke afọ 2018.

Ihe a mere n'ụzọ Woji nke "New GRA" dị na Portharcourt.

Image copyright Orji Chukwumela kelvin/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ndị ọchịchị steeti Portharcourt ekwuola na ha na-enyocha ihe a mere nụ.

Ha kwukwara na ọtụtụ ndị ọrụ na ndị na-atụ obere mgbere ahịa ka tọọrọ n'ime ya bụ ụlọ dara nụ.

Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ihe a mere kwuru na kamgbe elekere 8 nke mgbede November iri abụọ na atọ ebugala mmadụ ruru iri abụọ na abụọ meruru ahụ ụlọọgwụ ebe ha nọ na-anata ọgwụgwọ.

Image copyright Orji Chukwumela kelvin/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ndị ọchịchị steeti Portharcourt ekwuola na ha na-enyocha ihe a mere nụ.

Ndị ọrụ gbata gbata nakwa ndị , ndị nchekwa , nọ ebe ahụ na-azọpụta ndị ka tọrọ n'ime ụlọ elu ahụ dara ada.

EFCC ga-ezipute Diezani site na mba UK

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Diezani ka na-ago ebubo dị ya n'isi

Onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ịbuso mpụ na nrụrụka agha na Naịjịrịa, EFCC bụ Ibrahim Magu ebidola usoro a ga-eji zipute onye bụbụ minista na-ahụ maka mmanụ agbidi na Naijirịa akpọrọ Diezani Alison-

Madueke site na mba UK ruo Naịjirịa ka ọ bịa zara ọnụ ya n'ụlọ ikpe. Magu na ngalaba na-ahụ maka ịbụsọ mpu agha na mba Uk ezutela ị bịdọ nke

N'egwuregwu,

Image copyright NFF/twitter
Nkenke aha onyonyo Chikwelu Oparanozie bụ onye ndụ ndị Falcons na ya bụ egwụrụegwụ

Otu egwuregwu bọọlụ Naịjirịa ga-ezute Equitorial Guinea na asọmpi iko mba Afirịka ụmụnwaanyị na-agba.

Ha na-agba ka onye ọ bụla meriri nu nwete ohere ị banye asọmpi nke ga-esote agba ị nwete ebe atọ sotere agba nke ikpeazụ.

N'ofesi,

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Taiwan pụtara n'igwe mee ngharị iwe maka ịkwado alụma nwoke na nwoke maọbụ nwaanyị na nwaanyị

Mba Taiwan na-eme ntulịaka iji mara ka ha ga-abụ otu n'ime obodo dị n'Asia ga-eme ka mmekọrịta nwoke na nwoke bụrụ ihe na-adaghị iwu.

Cheta na Ụlọikpe kpebiri na alụma nwoke na nwoke adịghị njọ ma nyekwa ụlọ omeiwu afọ abụọ ịdọzi iwu a maọbụ wepụta nke ọ hụrụ.

Akụkọ ụwa na nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile
Image copyright XINHUA

Ndị ji egbe awakpola obi nnọchite anya mba China n'ala Pakistan.

Akụkọ kwuru na mmadụ anọ nwụrụ na mkpa mkpa a mana ndị uweojii gbagburu mmadụ atọ n'ime ndị a wakporo ebe ahụ.

Akụkọ kwukwara na onweghị onye mba China nwụrụ mkpa mkpa ahụ.

Boko Haram na nwakpo ndị agha Naịjirịa

Image copyright Getty Images

Ihe nkiri a na-ekegharị na soshal midia na-egosi ihe yiri ndi agha Naịjirịa ka Boko Haram na-awakpo ha.

Ihe a mere n'ọdọ ndị agha akpọrọ Metele dị na Borno.

Agbanyeghị na ndị agha Naịjirịa ekwubeghị okwu maka mwakpo a, ndị omeiwu Naịjirịa ekwuola na ha ga nyocha etu o siri mee.

Ipob emeela nghaghari iwe

Image copyright Nwonwu Nwabueze

Ipob ekwuola na nghagharị iwe ha mere bụ maka ikwupute ebumnobi ha gbasara ntuliaka 2019.

Ụkọchụkwụ Peace bụ otu n'ime ndị na-agbasa ozi Ipob gwara BBC Igbo na ihe ga-adị ha mma abụghị ka nwafọ bụrụ onyeisiala maọbụ osoteonyeisiala Naịjirịa.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Ọgba bọọlụ otu Chelsea bụ N'Golo Kante ebinyele aka n'akwụkwọ ga-eme ka ọ gbaa bọọlụ n'otu Chelsea ruo afọ 2023.

Nkeji abalị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile

Anụ nkịta

Obodo Seongnam dị na mba Saụt Koria emechiela ebe kachasị nnukwu ha na-anọ egbu ma ree anụ nkịta ruru nde kwa afọ.

Image copyright Getty Images

Ha ga-akwatucha ihe ndị a rụrụ ebe ahụ a na-akpọ "Taepyeong-dong complex", n'ime ụbọchị abụọ ma tụgharịa ya ka ọ bụrụ ebe ndị mmadụ na-abịa anọsapụ ahụ.

Ụlọoriri ebe a na-ere nkịta n'obodo Seoul, sitere na 1,500 daruo 700 n'afọ 2015.

Akwụkwọ Jonathan

Gọọmentị etiti etinyela ọnụ n'ihe gbasara ihe aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan dere n'akwụkwọ ya na nrụrụaka karịrị ugbua karịa oge ọ nọ n'ọchịchị.

Ọnụ na-ekwuchitere Onyeisiala bụ Garba Shehu kwuru na Jonathan na-etu ọnụ enweghị isi, kama ọ ga-ekwu na onweghị ikike ibuso mpụ na nrụrụaka agha maọbụ wepụta atụmatụ ga-akwụsị izu ego e kwesịrị iji rụọ ọrụ.

N'etiti PDP na APC

Ọnụ na-ekwuchitere PDP bụ Kola Ologbondiyan, kwuru na ha ma na obi na-amapụ ndị APC kemgbe ndị ọwụwa-anyanwụ na ndị mpaghara ọzọ kwuru na ha ga-akwadosi Abubakar Atiku ike.

Mana Joe Igbokwe na-ekwuchitere APC na Legọs kwuru na obi adịghị amapụ ha makana njem nleta ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ gara ileta Onyeisiala Muhammadu Buhari gosiri nnabata.

N'egwuregwu,

Sadio Mane bụ onye egwu si mba Senegal, agbatịkwuola afọ ole ọ ga-agbara Liverpool bọọlụ.

Image copyright Getty Images

Mane dị afọ iri abụọ na isii ugbua, batara Liverpool na 2016 ebe ọ ga-agbara ha bọọlụ ruo afọ 2023.

Ihe nkiri

Nwaanyị ji Igbo akụziri ndị mmadụ mgbakọ na mwepụ ekwuola na ọ na-eme ka ha mụta isiokwu ahụ ọfụma nakwa ọsịsọ.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwaanyị ji Igbo akụziri ụmụaka mgbakọ na mwepụ