Fayose: Ụlọ EFCC gbachiri bụ nkem - Onye omeiwu

Ụlọ Fayose n'Ado Ekiti EFCC gbachiri Image copyright Olasunkanmi Ogunmuko

Dika ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka bụ EFCC gara isi obodo Ekiti steeti bụ Ado Ekiti taa ga gbachisia ụlọ ụfọdụ ha sị bụ nke Ayo Fayose, otu onye apụtala sị na otu n'ime ha bụ nke ya.

EFCC kwuburu na ụlọ ndị a gbachiri metụtara nyocha ha na-enyocha Fayose.

Mana Samuel Omotoso bụ onye omeiwu n'Ekiti sị na mgbachi ụlọ a bụ "mmegide dịrị akụnaụba ya".

Omotoso sị na ihe EFCC mere bụ maka ya na Fayose dị na mma.

Image copyright Olasunkanmi Ogunmuko

"Ya bụrụ na-enyochara ọfụma ha ga-amata na akwụkwọ niile metụtara ụlọ gosiri na ọ bụ ezinaụlọ m nwe ya," Omotoso kwuru.

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade gwara BBC na okwu ọnu na-ekwuru Fayose bụ Lere Olayinka kwuru na ọ bụ ụlọ ndị nkiti ka EFCC na-agbachi abụghị eziokwu.

Orilade sị na ọ bụ ndị o metụtara kwesịrị iti mkpu maka mgbachi ụlọ ha.

Ugbua, Omotoso etiwala mkpu.

Cheta na EFCC na-enyocha Fayose maka ebubo na o tinyere aka na mpụ na nrụrụaka mgbe ọ bụ gọvanọ Ekiti steeti, nakwa ebubo ọzọ metụtara Sambo Dasuki.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara