Cyber Monday and Black Friday: Ị na-achị, ọ na-atọ gị, ị na-eri ego gị

Ndị a bịara ịzụ ahịa n'Owere Image copyright Luke Nwachukwu

N'agbanyeghị na o ruola afọ ole na ole ndị mba ọzọ malitere ime azụmahịa "Cyber Monday" na "Black Friday", ọhụrụ a ka o bidoro ịdọ ndị Naịjirịa n'ahụ.

Ka o sila dị, gị maọbụ onye ị ma nwere mmasị ịzụ ahịa na "Cyber Monday" nakwa "Black Friday", mana ị ma ihe ọ pụtara?

Gịnị bụ "Cyber Monday"?

Nke a bụ ụbọchị Mọnde na-esote ụbọchị Tọọzde nke anọ n'ime Nọvemba, mgbe e mechara "ekele" na mba Amerịka.

Image copyright Getty Images

Ọ na-abịakarị ma e mechaa "Black Friday", ka ndị mmadụ nwee ike zụrụ ihe n'ọnụ ala na-aga n'ihu.

Ọ malitere n'afọ 2005.

Gịnị bụ "Black Friday"?

Emume a malitere na mba Amerịka, bụ ụbọchị na-eso ụbọchị "ekele" a na-eme na Tọọzde nke anọ n'ime Nọvemba kwa afọ.

A na-ahụta ya dịka mmalite oge ndị mmadụ na-eji azụ ahịa ha ruo oge ekeresimesi, ndị na-ere ihe na-ejikwa ya arata ndị mmadụ n'ahịa ha.

Image copyright Luke Nwachukwu
Nkenke aha onyonyo Ebe ndị mmadụ kwụ na-eche ka enyochaa ihe ha zụrụ tupu ha akwụọ ụgwọ, n'otu ụlọahịa dị n'Owere

Mana ya bụ "Black Friday" na-ere isi abụọ;

Otu, ị nwere ohere iji aka gị họpụta ma zụrụ ihe ị chọrọ ịzụ mana nke abụọ bụ na ị laruo maọbụ ị zụchaa, ị nwereike ịhụ na ị zụtara ma ihe ị chọrọ ma nke ị na-achọghị.

Maka gịnị? Makana ihe bịara dị ọnụ ala, ị na-azụ etu masịrị gị maka na ị che na ego pere mpe nke bụ na ị ga-ejinwu obere ego zụta ọtụtụ ihe.

Ihe mere o ji amasị ndị mmadụ

Ọ na-amasị ndị mmadụ nke ukwu makana ụbọchị ahụ na-abịakarị otu ugboro n'ime otu afọ, na-enye ha ohere ịzụta ọtụtụ ihe na-etufughị nnukwu ego.

Ị gaa na mba ofesi, ị ga-ahụ ka ọtụtụ ndị bu oche nọrọ ala maọbụ kwụrụ n'ahịrị n'ihu ụlọahịa dị iche iche, ebe ha na-eche ka ụlọahịa ndị a mepee ka ha nwee ike kwobanye gaa rie ego ha.

Image copyright Luke Nwachukwu
Nkenke aha onyonyo N'otu ụlọahịa dị n'Owere, ndị mmadụ pụtara tupu ahịa ahụ emepee, ka ha na-eche ịzụ ahịa "Black Friday"

Ụfọdụ na-ebido n'abalị chi ga-efo ụbọchị ahụ, ka nwee ike ịbụ ndị mbụ ga-abanye.

1) Mbelata ego:

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ndị na-ewepụcha ihe ruru pasentị 70

N'ụbọchị "Black Friday", ndị na-ere ahịa na-ebelata ego, mee ka ihe ha na-ere dị oke ọnụ ala, bụ ihe Bekee kpọrọ "discount".

Atụmatụ a bụ ụzọ ha na-esi enweta ndị ahịa ọhụrụ, makana ndị amabughị maka ha maọbụ ndị anaghị azụbu ha ahịa ga-ejiri ohere ihe ịdị ọnụ ala bịa na nke ha ma zụta ihe etu ha chọrọ.

2) Ọnọdụ ahịa nọ:

Ebe ọ na-amasị ụfọdụ ndị ịga ebe a na-ere ihe nke Bekee kpọrọ "shopping mall", ọ na-amasị ndị ọzọ ịzụ ahịa nke ha n'elu ịntanetị.

Image copyright Getty Images

Maka ọnọdụ "ahịa" a, o meela ka ọtụtụ ndị nweta ohere ịnọ ebe ọbụla ha nọ zụọ ọtụtụ ihe ha chọrọ.

Ebe o si ka mma bụ na ị nwere ike ime ya n'elu ekwentị gị.

3) Izipụ ngwaahịa n'efu:

Nke a na-aka adabara ndị na-azụ ahịa "Black Friday" nke ha n'elu ịntanetị.

Nke bụ na ha tụkọtachaa ihe ha zụrụ, kwụọ ụgwọ, ndị nwe ahịa ahụ ga-ezite ya ebe ha nọ n'efu.

Ị na-azụ ahịa "Black Friday"? Gwa anyị etu o si amasị gị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: