Igbo Taboos: Ihe ise Ala na ndị Igbo na-asọ

Ezinụlọ a gburu Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ruo ugbua igbu mmadụ bụ arụ n'ala ọbụla

N'oge gboo, Igbo nwere ọtụtụ omume bụ arụ nwereike ibute ọnwụ ngwa ngwa maọbụrụ na mmadụ mee ya. Chiagozie Nnabuihe bụ ọkachamara na Mahadum Legọs n'ihe gbasara akwụkwọ gbasara Afịrịka nke a kpọrọ African studies na Bekee, kọwara na ọ bụ mmụọ bi n'ime ala bụ ihe na-asọ arụ ndị a.

Onye bụ mmọ Ala

Omenala kọwara na mmụọ Ala bụ nwaanyị.

A gafesie Chi-ukwu, ala bụ mmụọ kachasị mkpa n'ala Igbo.N'oge gboo, Igbo nwere nkwenye na ala nwere ike imesu onye ọbụla kpasuru ya iwe.Ọ bụkwa mmụọ a, na-ahụ na ihe niile a kọrọ n'ugbo mịrị mkpụrụ, na-ahụ na mmiri dị n'ala oge ọbụla.

Gịnị bụ ihe ise Igbo na mmụọ Ala na-asọ?

Igbu mmadụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onye ọbụla gburu mmadụ ga-eji isi ya buru njọ a

Ala na-asọ ọbara mmadụ. Nnabuihe kọwara n'Igbo nwere nkwenye na Ala bụ nne na-enye ndụ. Ya mere ka ọ bụrụ iwu na ọ nweghi onye ga-egbu mmadụ makana onye ahụ agaghị enwe ike inye ndụ. Ntaramahụhụ onye ọbụla gburu mmadụ bụ ịchụpụ onye ahụ n'ala ahụ maọbụ ịkpọrọ onyeahụ gawa ajọ ọhịa ebe ọ ga-anwụ.

Igbuonwe gị

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ala ga-ajụ onye gburu onwe ya

Dịka igbu mmadụ, igbu onwe bụkwa ihe ala na-asọ makana ọbara mmadụ dị n'ime ya. Nnabuihe kọwara na Ala na-ajụ ozu onyeọbụla gburu onwe ha. Tupu ha buru ozu onye ahụ gawa n'ime ajọ ọhịa, ndị dibia ga-achụ aja di icheiche iji sachapụ ajọ ihe ụdị ihe a nwere ike ibute n'ala ahụ. Ọ bụ mgbe e mechara emume a ka ndị ntorobịa ga-eburu ozu onye ahụ gawa ajọ ọhịa.

Idina onye si ezinụlọ gị

Image copyright Getty Images

Ihe a bụkwa ihe Ala na-ajụ bụrụkwa nnukwu arụ n'ala Igbo.Ọ bụrụ na nwa pụta na mmekọ a, ndị obodo ahụ ga-eburu ya gawa n'ime ajọ ọhịa ma chụpụkwa ezinaụlọ nwa ahụ n'ala ahụ.Igbo nwere nkwenye na Ala abụọla ezinaụlọ ahụ ọnụ.

Idina anụmanụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Arụ a na-ebute ọrịa

Ọ na-ahịa ahụ ịnụ na mmadụ mere ụdị ihe a n'ala Igbo.Mana mgbe ọbụla o mere, Igbo nwere nkwenye na Ala ga-ebunye onye ahụ ọrịa. Ọrịa a nwere ike ịbụ ara, ekpenta (Leprosy), afọ ọsịsa maọbụ nzịza (Dropsy) na ọtụtụ ndị ọzọ.Obodo ahụ ga-eji ngwa ngwa buru onye ahụ gawa ajọ ọhịa ebe ọ ga-anwụ.

Ịmụ ejima

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ụka Krist emeela ka Igbo kwụsị ọtụtụ iwu a

Nke a na-agbawa obi mana ọ bụ amaghị ihe butere ya.Igbo nwere nkwenye n'oge gboo na Ala bụ mmụọ na-enye ndụ na-enyekwa nwa na-enye di na nwunye sọọsọ otu nwa n'otu ugboro.Ha nwere nkwenye na nwaanyị ọbụla mụrụ ejima nwere mmekọrịta n'aka nwoke nke abụghị di ya. Ihe a na-eme ma nwaanyị mụọ ejima bụ na a ga-eburu ụmụaka ahu na nne ha gawa n'ime ajọ ọhịa ebe ha ga-anwụ.

Akụkụ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a