ASSU Strike 2018: Kpọghachị ụmụ anyị n'ụlọakwụkwọ - Ndị nne na nna

Akụkọ dị mkpa:

Akwa nne na nna na-ebe maka abụbọ ọrụ

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ

Ndị nne na nna akpọkuola Gọọmentị etiti ka ha biko gbata ọsọ enyemaka n'okwu banyere abụbọọrụ ndị nkuzi mahadum ka ụmụ ha nwee ike laghachị n'ụlọakwụkwọ.

Cheta na mkparịtaụka gọọmentị na ndị nkuzi nwere ụnyaahụ amịtaghị mkpụrụ dịka amabeghi mgbe nke a ga-ebi.

Nwoke ọzọ apụtala na ndụ n'ụlọelu dara na Pọrtharcourt

Image copyright Orji Chukwumela kelvin/Facebook
Nkenke aha onyonyo Ndị ọchịchị steeti Portharcourt ekwuola na ha na-enyocha ihe a mere nụ.

Otu nwoke apụta na ndụ site n'ụlọelu dara na Pọtharcourt nke Rivers Steeti n'ime ụbọchị atọ ụlọ ahụ dachara.

Otu onye ọrụ nchekwa Civil Defence gwara BBC na akpọpụtara nwoke ahụ n'otu onye ọzọ nwụrụ anwụ n'abalị ụnyaahụ.

Na mba Saụt Afrịka

Image copyright Getty Images

Na mba ọzọ mba Saụt Afrịka ebuliela ụgwọ opekatampe ndị ọrụ ha rue ego dị otu narị puku iri abụọ na isii nke ga-amalite n'ọnwa Jenụwarị afọ 2019.

Nke a na-abịa dịka Naịjirịa na ndị ọrụ ya na-agba mgba ka e bulie nke ha rue narị puku iri atọ.

N'egwuregwu

Image copyright Getty Images

Asọmpi Uefa Champịọns ga-amalite ọzọ, dịka Roma ga-ele Real Madrid ọbịa, Lyon ga-anabata Manchester City.

Ebe Juventus, Valencia, Manchester United, CSKA Moscow, Young Boys na ndị ọzọ ga-anọkwa na-egwu.

Nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAlex Otti: Ihe mere na Ndigbo anaghị etinye ego n'imepe ala Igbo

Otu onye uweojii gbagburu nwunye ya na nwanne ya nwoke n'ime ụlọikpe dị n'obodo Durban dị na mba Saụt Afrịka, ụnyaahụ bụ Nọvemba 26, 2018.

Image copyright Getty Images

Akụkọ kwuru na nwoke ahụ na nwunye ya gara ụlọikpe ebe ha tinyere akwụkwọ alụkwaghịm, mana ka a gara ezumiike nkeji 15, ọ batara were egbe gbaa nwunye ya na nwanne nwunye ya.

Ọ nwakwara ịgbagbu onwe ya ozugbo, mana e burula ya gawa ụlọọgwụ, ebe ụlọntaakụkọ news24 kwuru na o mechaala nwụọ maka mmerụahụ ọ merụrụ.

Anambara steeti

Image copyright GovernorObiano/Facebook

Gọọmentị Anambara steeti na ndị Igwe si mpaghara ọwụwa-anyanwụ, ahọpụtala ụbọchị iri abụọ na asatọ nke Disemba dịka ụbọchị ha ga-eji mee emume ibibi omenaala osu na mpaghara ahụ.

A ga-eme emume a n'obieze ndị Nri.

N'akụkọ ọzọ,

Otu pati APGA ekwuola na ha ga-amalite ịchụ nta vootu maka ọkwa onyeisiala n'Awka, n'ụbọchị isii nke ọnwa Disemba.

Na mba ofesi,

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na o kweteghị n'akụkọ na-ekwu na ọ bụrụ na mba ya etinyeghị anya na mmebi ihu igwe Bekee kpọrọ "global warming", na ọ ga-akpa mkpamkpa n'akụnaụba ha.

Image copyright Getty Images

Akụkọ ahụ kwuru na na mmebi ihu igwe a ga-efu Amerịka ọtụtụ ijeri dọla kwa afọ ma mmebikwaa ahụike ha.

N'egwuregwu,

Otu egwu ụmụnwaanyị Naịjirịa bụ Super Falcons, ga-ezute Kamerun n'asọmpi Iko mba Afrịka a na-agba na Gana.

Cheta na mba atọ ga-apụta n'asọmpi a, ga-aga asọmpi Iko Mbaụwa a ga-agba na Frans n'afọ 2019.

Gere akụkọ BBC n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Ihe nkiri

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAlex Otti: Ihe mere na Ndigbo anaghị etinye ego n'imepe ala Igbo