Ojukwu Memorial Lecture: Ka o si gaa

46354436

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionLee ụfọdụ otu bịara emume ncheta Ojukwu

Ndị otu Massob, ndị lụrụ agha Biafra, ndị Nollywood nakwa ọtụtụ Ndigbo ọnụ na-eru n'ọkwụ chịkọbara mmemme pụrụ iche iji kwanyere Dim Chukwuemeka Odimegwu Ojukwu ugwu.

Ezeigbo GburuGburu, Odimegwu Ojukwu bụ onye mbụ malitere zọba ka Ndigbo nwere onwe ha site na ikewapụ na Nigeria zawa Biafra n'afọ 1967.

Yabụ oku ọ kpọrọ butere ọgụ Biafra nke a sị tara isi ike karịrị nde mmadụ atọ.

Onye isi ndị otu Biafra Independent Movement(BIM) bụ Ralph Uwazurike ma bụrụ onye isi chikọbara ya bụ mmemme kọwara na Odimegwu Ojukwu dịka onye na-ejelụ ọha ozi.

Uwazurike kwuru na ọ bụ ụkpụrụ Ojukwu ka ọ na-eso wee ganye na-ekepụta Biafra.

Bianca Ojukwu bụ nwunye Ojukwu kelere ndị niile bịara kwanyere Ojukwu ugwu.

Bianca kwukwara na oge eruola mgbe ndị Igbo ga azọta orubere ha na atụghị egwu ọbụla.

Ọtụtụ n'ime ndị soro Ojukwu lụọ ya bụ agha, yị uwe agha ha na ụfọ ihe gosiri aka ọrụ ha were bịa ya bụ mmemme.

Otu nwoke kpọrọ onwe 'General' kọrọ na ya na Ojukwu soro lụọ agha, gabiga ihe nhịaahụ dị iche iche tupu ọ nwụ na 2011.

Yul Edochie kọwara Ojukwu dịka 'nnukwu mmọnwụ.'

Ndị Massob sị steeti dị ịche iche wee gbakọ na ya bụ ogige Ojukwu Library dị n'Owere.

Ọtụtụ mmadụ kwukwara okwu banyere ojukwu na ndụ ọm obiri nakwa ihe a ga ejị na echeta ya, dịka, Eze Reagent of Nri Kingdom, Eze Obidiegwu Onyesoh, Eze ndị Eze, HRM Eze Ilomuanya, HRH Eze Ohu 1 nke Ohu kingdom, Eze ka Eze n' Opi Nsụka, Igwe Willly Ezeugwu na ndị ọzọ.

Ndị Massob guzobekwara mmemme ịkwụ na ahịrị na n'ahịrị.

Ebe mmanwụ ndị ọzọ, ndị egwu dị iche iche na nri na akụrụngwa Ndigbo mepụtara bụ nke e gosiri ebe ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a