Divorce: Etu e si eme ya n'ala Igbo

Di na nwunye Image copyright Getty Images

Di na nwunye ịkwasa alụmdinanwunye ha anaghịzị ara ahụ n'ụwa ugbua, mana ọ bụ ihe na-eme n'ala Igbo?

N'ala Igbo, di na nwunye anaghị anọkata teta n'ụra sị na ha anaghị alụzị, maọbụ nwaanyị alụziri ọfụma akwara akpa ya pụọ n'ụlọ di ya na-echeghị ya eche ọfụma.

E nwere usoro a ga-eme n'omenaala tupu nwaanyị esi n'ụlọ di ya pụọ, makana Igbo kwenyere na onye lụrụ di ga-alụ ya ruo mgbe ebighiebi.

Ịgba alụkwaghịm

Alụkwaghịm n'ala Igbo pụtara na di na nwunye ahụ ekwenyela na enweghịzị ihe ga-ejikọ ha na ezinaụlọ ha karịa ụmụ ha.

Mgbe gboo, ịgba alụkwaghịm rara ezigbo ahụ, nke bụ na ezinaụlọ nwoke chọrọ ịchụpụ nwunye ya, ga-ebu ụzọ nwee ọgbakọ ebe ọ ga-akọwa ihe mere o ji chọọ ịkpọla ya.

Ha ga-ekpe ikpe dị na ya, tulee uche ịmata ma ihe o kwuru ozuru iji chụpụ nwaanyị na di.

Usoro alụkwaghịm

Ezinaụlọ abụọ ahụ (nke nwaanyị na nke nwoke) ga-agbakọta, tulee ọnọdụ ahụ ọzọ, jụọ ajụjụ ma gere ihe ha nwere ikwu, taa ha ụta, dụọ ha ọdụ, tupu ha ekpebie ma alụmdinanwunye ha a ga-ebi ka ọ gaghị ebi.

Ha kpebie, ezinaụlọ abụọ ahụ ga-agbakọta n'ụlọ nna nke nwaanyị dịka ọ dị oge ha gbara nkwụ; ezinaụlọ nke nwaannyị ga-akwa ezinaụlọ nke nwoke ọbịa (nye ha ọjị, mmanya na nri).

Ụfọdụ na-eme emume ahụ ka ọ dị ka ụbọchị di na nwunye ahụ gbara nkwụ.

Na ngwụcha, nna nwunye ya ga-enyeghachị ya ego ole e ji kwụọ ụgwọisi nwa ya. Bido mgbe ahụ gawa n'ihu, alụmdinanwunye ha akwụsịla.

Ihe nwereike ibute ịgba alụkwaghịm n'ala Igbo

1) Amụtaghị nwa:

Ndị Igbo anaghị eji nwa egwu egwu, ọkachasị nwa nwoke.

Image copyright Getty Images

Ọ bụrụ na di na nwunye amụtaghị nwa, ọtụtụ oge ọ na-ebute alụkwaghịm, makana ezinaụlọ nwoke ga-ebido inye ya nsogbu gaa kpọta nwaanyị ga-amụtara ya nwa.

2) Ịgba n'ezi ọkachasị ma ọ bụrụ nwaanyị:

Ndị Igbo kwenyere na ịgba n'ezi bụ njọ nye ma Chukwu, ọha, ezinaụlọ onye nakwa di maọbụ nwunye onye gbara n'ezi.

N'ụfọdụ obodo, nwunye mmadụ gbaa n'ezi, di ya anwụọ maọbụ ihe ọjọọ emee. Nke a mere ụfọdụ na-eji ahapụ ka a gbaa alụkwaghịm ma otu onye gbaa n'ezi; ka ihe ọjọọ ghara ime.

3) Enweghị ike ịlekọta ezinaụlọ:

Nwoke na-enweghị ikike ịlekọta ezinaụlọ ya, nke a bụ mbido nsogbu ya.

Image copyright Getty Images

Makana ọtụtụ oge, ọ na-ebute mkparị nke na-ebute esemokwu na-ebutekwa alụkwaghịm.

4) Mmegbu:

Nwoke na-emegbu nwunye ya maọbụ nke na-eti nwunye ya ihe, nwereike ịhụ na ọ ga-achọ ịgba ya alụkwaghịm.

Nwunye ya nwere ike gakwuru nna ya gwa ya na ọ chọghịzị ịlụ di ya.

Ụdịrị nke a mee, nna ya nwere ike kpọkuo ndị ọgọ ya, nyeghachị ha ụgwọisi ha kwụrụ, ma kpọrọ nwa ha.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a