Anambra state House of Assembly: Agbagheela ụlọomeiwu ha

Ọfọ ụlọomeiwu Image copyright Twitter/Nass

Ndị Uweojii Anambara steeti kwuru na ha agbagheela ụlọomeiwu steeti ahụ ka ọgbaghara dapụtara ebe ahụ belatara.

N'ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed zipụtara, o kwuru na ndị isi ụlọomeiwu ahụ ziteere ha akwụkwọozi n'ụbọchị 28 nke ọnwa Nọvember, 2018, ebe ha gwara ha gbapee ụlọọrụ ha ka ha nwee ike rụọ ọrụ.

N'ihi nke a, kọmishọna ndị uweojii steeti ahụ bụ Garba Baba Umar, nyere iwu ka a gbaghee ụlọomeiwu ahụ ozugbo ozugbo.

O kwukwara na ndị uweojii ga-anọ n'akụkụ ụlọomeiwu ahụ ichekwa ebe ahụ maka igbochi ihe ndapụta nwereike ịdapụta.

Cheta na n'ime izu ole gara aga, na ọ bụ ndị ụlọomeiwu ahụ kpọkuru ndị uweojii ka ha bịa gbachie ụlọọrụ ha, iji gbochie ọgbaghara ịdapụta ebe ahụ.

Ọgbaghara ahụ dapụtara ka ụfọdụ ndị omeiwu ahụ gbakọtara aka chutuo onyeisi ha bụ Rita Maduagwu, mana Maduagwu gbadosiri ụkwụ ike, kwuo na ọ ka bụ onyeisi ụlọomeiwu steeti ahụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara