Okorocha: Aga m akwado ọgọ m ma ọ gaa pati ọzọ

Rochas Okorocha Image copyright PIUS UTOMI EKPEI
Nkenke aha onyonyo Aga m akwado ọgọ ma ọ ga pati ọzọ

Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha egosila na obi adịghị ya mma na ọgọ ya bụ Uche Nwosu enwetaghị ikike pati APC ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

Na mkparitaụka ya na ndị ntaakụkọ nwere n'Owere ụbọchị Tuzde, Okorcha gwara Uche Nwosu na ndị ọzọ obi adịghị mma n' APC Imo ka ha tinye isi ebe masiri ha ma kwe nkwa ịkwado ha.

"Ihe ga-eme bụ na ha gawa ebe ọzọ ịchụ ebumnobi ha ebe masịrị ha, aga m anọgide na APC ma kwado ha. "

Nwosu na mmadụ karịrị 20 ndị zọrọ maka iweta ikike ịnọchịte anya mpaghara ha n'ụlọomeiwu nke steeti ahụ n'aha pati APC gba aka efu.

Image copyright @Honuchenwosu

Ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ bụ: Ọ bụ na nzọpụ ụkwụ a Okorocha na-azọpụ agaghị ememila otito APC n'Ala Igbo?

Ọ bụ na ọ gaghị emetụta onyeisiala Buhari inweta vootu n'Imo steeti nakwa ala Igbo niile na 2018?

Nke a bụ n'ihi na Okorocha bụ onye wetara pati APC na steeti ahụ.

Nke ọzọ bụ na ọ bụ Okorocha bụ naanị gọvanọ APC nwere n'ala Igbo.

Na nkọwa ya , otu onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Nnamdị Okenwa kwuru na mkpebi Okorocha ga-ebute mgbanwe.

'Ihe ọ ga-agbanwe riri nne."

Mana Okenwa, onye bụ onyenkuzi na mahadum, Enugu State University, dọrọ aka na ntị na nzọpụ ụkwụ ahụ nwere ike ịda aka nri maọbụ aka eke.

"Onye APC họrọ nwere ike nwe mmeri maọbụ Uche Nwosu enwe na pati ọ ga-aga. "

'APC na pati ha ga-aga ga-enwe nkwekọrịta'

N'aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru APC na steeti ahụ bụ Jones Onwusoanya, kwuru na ''APC ga-enwe nsogbu n' Imo steeti na Ọwụwa-anyanwu niile.

"Ọ bụ Rochas wetara APC na Imo steeti' ma bụrụkwa onye pati ahụ na steeti ahụ na akwado.

Ọ gara n'ihu kwuo na pati ọbụla Uche Nwosu ga-aga, APC na pati ahụ ga-enwe nkwekọrịta (alliance).

"Ha agaghị enwe onye ga-azọ ọkwa onyeisiala kama ha ga-atụnyere Buhari na 2019."

'Ọ bụghị naanị Rochas wetara APC n'ala Igbo'

Image copyright Toe Ekechi

Mana ndị otu APC agbadoghị Okorocha kwuru na nkwado Rochas ga-enye pati ọzọ enweghị ihe ọ pụtara APC.

Otu onye n'ime ha bụ Toe Ekechi gwara onyentaakụkọ BBC na o nwere ndị soo Rochas were webata APC n' Imo dịka Osita Izunaso, na ndị isi pati ahụ na steeti dịga n'ala Igbo.

Ekechi kwuru na ọnọdụ APC ga-aka njọ ma Okorocha nọrọ na pati karịa ma ọ bụrụ na ọ pụọ maọbụ nye ọgọ ya nkwado na pati ọzọ.

"Rochas emela ọtụtụ ihe na-ewe ndị Imo,Ndigbo iwe, ha were na-eche na APC bụ pati ọjọọ."

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a