Ipob: Lee foto onye uweojii nwụrụ n'ọgbaghara mere na Nnewi

Uweojii Image copyright Nigeria Police Force
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-ekwu na ndị otu Ipob kugburu Inspector Akinbami ụbọchị ahụ ha mere ngagharịiwe na Nnewi

Dịka ndị na-agụ akụkọ BBC Igbo si rịọ, anyị gara nyocha ọzọ banyere mwakpo mere na Nnewi.

Nke a mere ka ndị uweojii nọ n'Anambara steeti wepụta foto onye otu ha ahụ ha kwuru na ndị otu Ipob Kụgburu ụbọchị ha mere ngaghariwe na Nnewi

BBC Igbo nwetara aha onye uweojii a sị nwụrụ dịka Inspector Akinbami Olaniyi na-arụ dịka CPS na Nnewi.

BBC Igbo chọpụtakwara na ndị ahịa mechiri ahịa niile dị na Nnewi ruo ụbọchị abụọ.

Ndị azụmahịa na Nnewi site n'ọnụ onyeisi ndị na-azụ ahịa na Nnewi bụ Muozom Edward, na-ekwusi ike na ha amaghị na ndị otu Ipob bịara ụbọchị ahụ.

Ha na-ekwukwa na ebe ihe a mere dịchapụrụ n'ebe ndị otu Ipob nọ wee kpaa mkpamkpa a.

Etu ụfọdụ ndị na-agụ akụkọ BBC Igbo si depụta mkpa ha n'akara Facebook

Nkenke aha onyonyo Ihe MikeGodwithme kwuru

MikeGodwithme kwukwara na ọ chọrọ foto na-egosi onye uweojii ahụ nwụrụ na ngagharịiwe Ipob mere na Nnewi.

Nkenke aha onyonyo Ihe MikeGodwithme kwuru

Cheta na gọvanọ Anambara bụ Willie Obiano gara Nnewi ịhụ ndị merụru ahụ n'ọgbaghara dara n'etiti ndị Ipob na ndị uweojii n'obodo ahụ, ọ rịọrọ ka ahụ na-atọghapụrụ ndị aka ha dị ọcha.

Nkenke aha onyonyo Ahịa Nkwọ Nnewi ebe ndị uweojii sị na IPOB gbara ụgbọala ha ọkụ

Nke a na-abịa ka ndi isi ahịa Nkwọ Nnewi gbachiri ya bụ ahịa.

Ngalaba na-achikọta ahịa Nnewi gbachiri ahịa ahụ ụbọchị ole na oke gara aga, makana ndị otu ha asị na ndị uweojii nwụchiri n'ụbọchị Fraịde gara aga.

Cheta na ndị uweojii nwuchiri mmadụ iri atọ na abụọ ha sị na aka ha dị na mwakpo na ogbugbu onye uweojii aha ya bụ Akinbami Olaniyi.

Nkenke aha onyonyo Ahịa Nkwọ Nnewi ebe ndị uweojii sị na IPOB gbara ụgbọala ha ọkụ

Agbanyeghi na ọtụtụ n'ime ndị a eji sị na ha bụ ndị ahịa, ndị uweojii sị na ha so memina ndị otu ha.

Otu onye uweojii achọghị ka BBC kwuo aha ya sị; "E gburu onye uweojii, ma gbaa ụgbọala anyị ọkụ, ndị a aka ji bn̄ụ ndị a hụrụ mgbe ndị uweojii ruru ebe ahụ."

Nkenke aha onyonyo Ahịa Nkwọ Nnewi ebe ndị uweojii sị na IPOB gbara ụgbọala ha ọkụ

Ndị hụrụ mgbe ihe mere gwara BBC na ọ bu ndi na-ere ahịa n'ahịa ahụ ka aka ji.

Lee ihe ha kwuru ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media caption‘Mkpamkpa ndị uweojii mere e jiri gbaa ụgbọala ha ọkụ’

BBC gbara Kọmịsọna na-ahụ maka mgbasa ozi n'Anambara Steeti bụ Don Adinuba ajụjụ ọnụ maka njem Obiano na Nnewi.

Maazi Adinuba gwara BBC na Obiano gara Nnewi ileta ndị nọ n'ụlọọgwụ.

Maka okwu Nkwọ Nnewi, Adinuba kwuru na Obiano na-agba mbo ịhụ na ahịa ahụ mepere ọsịsọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a