Aba Lynching: Gịnị mere e ji kpọọ ndị mmadụ ọkụ n'Aba?

bonfire Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ịgba ndị eche na ha bụ ndi ohi ọkụ bụ ihe na-emekarị na Naịjirịa (Foto a abụghị nke ụdịrị ihe a)

Akpọọla mmadụ abụọ a na-eche na ha bụ ndị ohi ọkụ n'Aba nke Abia Steeti.

Anya hụrụ ka ihe a ji mee kwuru na mmadụ abụọ ndị a so n'ime mmadụ atọ a sịrị wakporo otu nwaanyị gara dọrọ ego n'otu ụlọakụ dị n'ụzọ Aba-Owerri.

Onye a na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị nwoke atọ ahụ ji ọgbatumtum napụrụ nwaanyị a egọ dị puku narị naịra atọ na iri ise.

Nke a mere nwaanyị a ji na-eti mkpu, mgbe ndị mmadụ nụrụ mkpu ya ha chụwara ndị ahụ ọsọ.

Oge ha rutere ebe ụzọ kpọchiri n'ihi kpachikpachi ụgbọala ka ndị mmadụ nwuchiri ha mana otu onye n'ime ha gbara ọsọ.

Ndị mmadụ malitere kụwa ha ihe rue oge ọnwụ ha ma mechaa kpọọ ha ọkụ.

Onye ọzọ hụrụ ka ihe ji mee kwuru na ọ dịla anya ndị omekome kpawara ike na gburugburu ebe ahụ.

Mgbo BBC Igbo gbara n'inwete ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia Steeti bụ Geoffrey Ogbonna mana ọ zaghị ekwentị ya.

Chidi Ike bụ onye oji ego achụ ego n'Aba gwara BBC Igbo na ihe na-akpatakarị ndị mmadu na-egbu ndị ha jidere n'ụdịri ihe a bụ maka iwe nakwa uche na onweghi ihe ndị uweojii ga-eme ha.

"Ndị dabara n'aka ndị na-ewe ezigbote iwe ma ha hụ onye eboro ebubo na ozuru ohi," Maazi Ike kwuru.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndi mmadụ na-eche na ha were ndị a kpanye n'aka ndị uweojii, enwereike onweghi ihe ga-eme ha.

"Ụfọdụ na abụ, eche ha pụta, malite ikpa ike n'obodo."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara