#Fight4Naija: Kedụ onye bụ osote Oby Ezekwesili?

Oby Ezekwesili/Galadima
Nkenke aha onyonyo Ezekwesili kwuru na ọ ga-akpọpụta ụmụ Naịjịrịa ruru nde iri asatọ n'ụbịam

Ụfọdụ ụmụ Naịjiria kwuru na etu Oby Ezekwesili si họpụta onye ugwu dịka osote maịrị ha.

N'otu aka ahụ, ụfọdụ kwuru na Ezekwesili na-arọ nrọ ma kwuo na Ganiyu Galadima abụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị ama ama.

Cheta na Ezekwesili depụtara n'akara Twitter ya na Galadima dịka osote ya ga-enyere ya aka ịmata ndị a nachị nọ n'igbe ụlọ, ọfụma.

O kwuru na Galadima ghọtara ebumnobi ya gbasara ịchị Naịjirịa ma kweta na ọ ga-enyere ya aka nke ukwu n'iweta ya na mmezu.

Onye bụ Ganiyu Galadima?

  • Amụrụ ya n'ụbọchị iri na otu ọnwa Jun nke afọ 1964
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Kwara steeti ebe o mechara bụru otu onye n'ime otu ndị na-achị n'ụlọakwụkwọ ahụ
  • Ọ bụbu onye zọrọ oche onyeisala n'okpuru pati ACPN n'afọ 2015
  • Ọ bụ onye oji ego achụ ego

Ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-ekwu maka nhọpụata a n'elu soshal midia:

Armstrong Armstrong kwuru na ihe Ezekwesili mere gosiri amamihe.

Keezy Boiwonda, na-ajụ ihe mere Ezekwesiri ji họrọ onye "Hausa" karịa ịhọrọ onye Fulani.

Image copyright Chioma Obianinwa
Nkenke aha onyonyo Ihe Keezy Boiwonda kwuru

Mana Onyia Fabian Nnamdi, gwara Ezekwesili ya gaa zuo ike makana ọchịchị Naịjirịa abụghị nke ndị Igbo.

Nkenke aha onyonyo Ihe Onyia kwuru

Azi Somtochukwu na-ajụ ma enweghị onye chọrọ ịhọrọ onye Yoroba dịka osote ya n'ọsọ ntuliaka nke ugbua?

Nkenke aha onyonyo Ihe Somtochukwu kwuru

Akụkọ ndị ga-amasị gị: