World AIDS Day: 'A rịala m ọrịa HIV/AIDS ruo afọ anọ ka kwụrụ chim'

World AIDS Day: 'A rịala m ọrịa HIV/AIDS ruo afọ anọ ka kwụrụ chim'

Ụbọchị December 1 nke afọ ọbụla bụ nke ngalaba ahụike mba ụwa ji eme ncheta agha a na-ebuso HIV gụnyere mgbochi ya, nyocha ya, nlekọta ọgwụgwọ ya, dgz.

Dịka ngalaba World Health Organisation si depụta, ncheta nke afọ 2020 na-ebu aka maka mkpa mkpa covid na-akpa na mba ụwa niile mana a na-aja ndị nọ n'ihu agha a ike.

Otu onye rịagoro ọrịa site n'afọ 2014 ruo afọ 2018 gwara BBC ka o si were ọnọdụ a na-enyere ndị mmadụ aka site n'ịgwa ha okwu nkasiobi nakwa ihe ha ga-eji ndụ ha mee n'ọnọdụ di etu ahụ.

O kwukwara na mgbe ọ chopụtara na ọ na-arịa ọrịa a, ọ maghị ka ọ ga-esi gwa nne na nna ya.

Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe nkiri a.

Isiokwu #WorldAIDSDay nke afọ 2018 bụ "mara ọnọdụ gị".

Ọtụtụ ngalaba ahụike mbaụwa ekwuola obi ha gbasara ncheta ụbọchị HIV/AIDS.

Otu n'ime ha bụ World Health Organisation. Ha kwuru na otu onye n'ime mmadụ anọ ọbụla na mbaụwa niile nwere ọrịa HIV/AIDS mana ha amaghị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: