EFCC: Nwụchie Alison-Madueke - Ọkaikpe

Akụkọ dị mkpa

Nwụchie nu Alison-Madueke - Ọkaikpe

Diezani Alison-Madueke

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Diezani ka na-ago ebubo dị ya n'isi

Ụlọikpe ukwu dị n'Abuja enyeela ụlọọrụ EFCC ikike ka ha nwụchie onye bụbu minista na-ahụ maka mmanụ agbịdị bụ Diezani Alison-Madueke.

Ọkaikpe Valentine Ashi chabiri ikpe a n'ihi ebubo dị ise eboro Diezani nke gụnyere inye onyinye n'ụzọ n'ezighi ezi.

Atiku na Obi Amalite ọsọ achụnta vootu

Ndị isi okpokpo n'otu ndọrọ ndọrọ PDP

Ebe foto si, @OfficialPDPNig

Onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala bụ Atiku Abubakar na osote ya bụ Peter Obi amalitela ịgba ọsọ achụm nta Vootu na Sokoto Steeti.

N'ozi ha wepụtara n'akara twitter ndị PDP, ha kwuru na ntuliaka 2019 bụ maka ọdịnihu ụmụaka na ndị ntoroọbịa Naịjirịa.

N'ofesi

Ndị isi mba US na China

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na mba China ka ewepụ ego dị pacenti iri anọ n'ụtụisi ụgbọala ha bugara na mba ahụ.

Mana mba China ekwubeghi ma okwu a si n'akara twitter Trump ọ bụ eziokwu ka ọ bụ asị.

N'egwuregwu

Klopp na Alisson

Ebe foto si, Getty Images

Otu na-ahụ maka asọmpi Premier League eriela onye nchịkọta otu Liverpool bụ Jurgen Klopp iwu maka ịkpa agwa ọjọọ.

Klopp ji ọsọ gbaba n'ime ọgbọ egwuregwu ga makọọ onye oche bọọlụ ya n'asọmpi dị n'etiti Liverpool na Everton.

Nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo,

Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ

Taa bụ ụbọchị ncheta ndị nkwarụ

Ndị nwere nkwaarụ na-agbasi mbọ ike

Ebe foto si, Getty Images

Emume ụbọchị ncheta ndị nwere nkwarụ maọbụ ndị ike dị na obi amalitela n'uju na Anambra steeti ebe Ezenwaanyị steeti ahụ bụ Ebelechukwu Obiano mepegoro ya bụ emume nke aga eme izu ụka a niile.

Onye nchikọta ndị otu a akpọrọ National Association of Persons Living with Disabilities bụ Comrade Ugochukwu Okeke kwuru na emume nke afọ a gbadoro ụkwụ na ịnabata ndị ike dị n'obi ka ọnụ na-eru ha n'okwu.

Boko Haram egbuola ndị agha Naịjirịa abụọ

Ndị agha Nigeria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ndị agha ka na-ebuso ndị agha iyi egwu dị iche iche agha n'ala Naịjiria

Ndị ọlụọọla bụ Boko Haram egbuola ndị agha Naịjirịa mmadụ abụọ ọzọ na nwakpo ọhụrụ ha wakporo ndị agha na Yobe steeti.

Nke a na-eme ka arụmarụ na-aga n'ihu maka otu ijeri naịra amapụtara maka ibu agha ndị omeketereihepụụjọ bụ nke ọchịagha Tukur Buratai sị na ọ ga-eru ha aka mgbe adịghị anya.

Ọgbakọ mbaụwa mbaraeligwe na ụwa

mbaraeligwe

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto,

Ọgbakọ mbaụwa maka mbaraeligwe na ụwa na akpọtụ na Poland taa

Ndị ọnụ na-eru n'okwu na ihe gbarasara ọnọdụ mbaraenikwe n'ụwa bekee kpọrọ Climate Change ekwuola na ụwa anyị nọ n'ime ya nọzị na agbata mmụọ na mmadụ.

Ha kwuru nke na Poland bụ ebe nzụkọ ndị otu a na-akpọtụ bụ ebe ha nọ dọọ aka na ntị ka ebelete anwụrụ ọkụ ọjọọ iji zọpụta ụwa.

Iko anyị buru ga-akpalite mmụọ anyị

Oneme Ebi

Ebe foto si, Onome Ebi/Twitter

Nkọwa foto,

Oneme Ebi onyi otu n'ime ndí akpụobi ndị Super Falcons

N'egwuruegwu, Ka ndị Super Falcons gbara ụkwụ na Abuja ụbọchị Satọde, nwada Onome Ebi otu ekwuola n'iko a ha butere ewulitela mmuo ha maka nkwado igba iko mba ụwa ụmụnwaanyị na afọ ọzọ.

Na mmechi, ekpụghela amụma ibido Uefa Champions lig nke abụọ na 2021.

Gọmenti ewezụgala iwu Onye rụọ orie

Ndị ụmụakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ ejila afọ ise gụọ akwụkwọ ha kwesịrị ịgụ afọ anọ

Gọmenti etiti ewezugala iwu ọnye rụọ ọrie ha kwadoburu ịnye ndị Nkuzi mahadum nọ abụbụ ọrụ.

Onye nchikọta ndị Academic Staff Union of Universities, ASUU bụ Ọkammụta Biodun Ogunyemi kwuputara nke mgbe ọ na-aza ndị nta akụkọ ajụjụ.

Gee nkeji anyị ebe a

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo,

David Anyaele na-akpọku na ndị Igbo maka mbinye aka 2019

Akụkọ ga-amasi gị