Nigerian Police: Ndị uweojii 2000 na-aga agha Boko Haram
Akụkọ ndị kacha mkpa:
Ndị Uweojii ga-aga agha ndị Ọmekataraihepụụjọ
Ebe foto si, NPF/Twitter
Ndí uweojii Naíjiría akwadola ílúsa ndí Omeketereihepúújó agha
Onyeisi ndị uweojii ekwuola na ha ga-etinye ndị ọrụ ha rụru puku abụọ ọzọ n'ọrụ ibuso ndị ọmekereihepụụjọ bụ Boko Haram agha na ọdịdaanyanwụ nke ugwu awụsa.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Jimoh Moshood gbara ama a n'ụbọchị ọka n'isi ụlọọrụ ha n'Abuja.
Ihe Charlie Boy gwara Gọọmentị etiti
Ebe foto si, Charlie boy
Onye nchịkọta Our Mumu Don Do bụ Charlie Boy Oputa ekwuola na ntuliaka 2019 apụghị imezu ma ọgbaghara na-ada na mpaghara Naịjirịa niile diri gawa.
Charlie Boy kwuru nke a mgbe ha mere ngagharị udo n'ụzọ Isolo nke Legos steeti bụ ebe ọ nọ gwa gọmenti ka ha jisike bịe ọgbaghara niile ndị a tupu ya bụ ntuliaka eruo.
Ndị ahịa mmanụ ụgbọala adọọla gọọmentị aka na ntị
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ahị mmanụ ụgbọala akwadowela ịgba arụkwaghị
Ndị ahịa mmanụ ụgbọla na Naịjirịa adọọla gọọmenti etiti aka na ntị ka ha gbaa mbọ kwụọ ha ụgwọ eji ha nke ruru ijeri narị naira asatọ (N800b).
Okaiwe ndị otu a bụ Patrick Etim kwụrụ na emeghị otu a n'ụbọchị asaa na abịa ga-eme ga-eme ka ndị otu ha wụsa ọwara na Naịjịrịa gbaa gburu gburu.
N'ofesi
Ebe foto si, EPA
Emmanuel Macron na ndí órú ya
Ihe ruru mmadụ atọ anwụọla na ngagharị iwe n'eme an mba France maka ego mmanụ ụgbọla rịri elu.
Onyeisi mba ahụ bụ Emmanuel Marcon nọ n'isi oche nzụkọ ọtawaike ihụ ka aga esị nwete ya bụ ọgbaghara nke ọtụtụ mmadụ merụgoro ahụ na ngwucha.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
Chelsea na Fulham
N'egwuruegwu, chelsea ewerela ọkpụ abụọ nyụọ ndị Fulham ịkpakwụ ebe Arsenal ji ọkpụ anọ asatara abụọ gbara isi onwe n'aka Tottenham n'asọmmpị Premier lig.
Ọzọ, ndị otu Super Falcons awụchiela na ọdọ ụgbụọle Abuja ka buchere iko AWCON na ụbọchị Satọde.
Gee nkeji BBC Igbo mgbede
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri
Lee emume iri ji ndị Arochukwu
Wepụ ego mgbakwụnye mmanụ
Ebe foto si, @obyezeks
Onye na-azọ ọkwa onyeisiala n'aha otu ACPN bụ Oby Ezekwesili akpọọla oku ka gọọmenti kwụsị ego mgbakwụnye ha na-akwụ na mmanụ ụgbọala nke a kpọrọ 'fuel subsidy' na bekee.
Ezekwesili, onye kwuru nke a na akwụkwọozi o wepụtara kwuru na kama ịkwụ ihe karịrị otu tari naira nke e nweghị ọ na-abara ndị obere mmadụ, ọ ga-aka mma ịhaziharị ngalaba mmanụ ka a na-ere mmanụ ihe ọ na-ada n'ahịa.
Naijiria kachasị nwe ụmụada erughị eru lụọ di
Otu United Nations ekwuola na Nigeria bụ mba kachasị nwe ụmụada akpọnyere di na erughị eru dịka e nwere ụmụada nde iri abụọ na atọ a lụrụ na nwata.
Onye ọrụ mgbasasaozi otu UN bụ Dkta Seyi Soremekun kwupụtara nke n'akwụkwọ si o depụtara ụbọchị Satode kwuru na ọ bụrụ na egbochighị ya, n'afọ iri na-abịa, a ga na-enwe ụmụada erughị afọ iri na asatọ karịrị puku iri na anọ a ga na-eke di kwa afọ.
Nwaneku atọrọla ụmụaka abụọ na Legọs
Ebe foto si, Getty Images
Otu nwaneku atọrọla ụmụaka abụọ ọ na na-eleta na Legọs.
Ka o mechara abalị asatọ e jiri were ya n'ọlụ, nwaneku a kpọrọ Busayo gara n'ụlọ akwụkwọ ụbọchị Fraide tọrọ ụmụaka nne ya ukwu abụọ gbafuo, ebe ekwenti ya gbanyụrụ agbanyụ kemgbe ahụ.
Mba Amerịka na China
Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, mba Amerika na Japan ekpebiela na ha ga-ejide ume ha ọnwa atọ n'ebumnobi ha ijikọta ma bulie ụgwọ isi ha na-ana na ṅgwaahịa sị mba China, ebe China na-ekwe nkwa ị na-atụbata ngwaahịa dịka ihe ubi na akọrọọngwa ụlọọrụ sị Amerịka.
CAF: Oparanozie,Oshola aagahị eso
Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu,
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekelela ndi otu egwu bọọlụ Super Falcon maka ibuli iko AWCON ebe ha ji ọkpụ anọ asatara otu merie mba Saut Afrika n'asompi e mere ụbọchị Satọde.
Buhari tokwara ndị nchikọta otu egwu bọọlụ ahụ, ndị nkwado ha nakwa ụmụ Naijiria niile maka mmeri ahụ nke bụ nke itoolu n'ime agba iri na otu e merela asompi egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyị Afrika.
Gee akụkọ ndị a ebe a:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile