Child brides: Naịjirịa nwere ụmụada ụmụaka nde 23 ekenyere di na erughi eru

Ụmụada

Agbanyeghi na ụmụada ịlụ di n'erughi opekata mpe afọ 18 na-ebute ọtụtụ nsogbu ahụike na mwulite ezinaụlọ, ọtụtụ ezinaụlọ na-aga n'ihu ikenye nwa ha di n'erughi eru.

Dịka otu mbaụwa nke a kpọrọ United Nations na bekee siri kwuo, ụmụada ụmụ Naịjirịa alụruola di nde iri abụọ na atọ (23million).

Ọnụọgụgụgụ a mere Naijiria mba kachasị nwe ụmụada lụrụla di erubeghị eru a kwanyere n'ịlụ di na nwata.

Onye ọrụ mgbasasaozi otu UN bụ Dọkịta Seyi Soremekun kwupụtara nke a n'akwụkwọ ozi o depụtara n'ụbọchị Satode.

Kedụ ọghọm dị n'ikenye nwata di?

Dịka dịbịa ahụike ụmụnwaanyị bụ Dọkịta (Sr) Paschalina Ezechukwu siri kọọwa, ọtụtụ ọghọm dị na nwada nwata ịlụ di.

Nke a bụ n'ihi na dịka Ezechukwu, onye na-arụ n'ụlọọgwu Mother of Christ, Enugwu, siri kọwa, ọkpụkpụ ukwu ya esibeghị ike.

Ọghọ m ndị ahụ gụnyere:

1. Ihe ọdịdọ nke a kpọrọ 'pre-emclampsia' maọbụ 'emclampsia' na bekee na-akarị n'ụmụada etorughi etoru n'ịtụrụ ime.

2. O nwereike inwe nsogbu bụ anaghị anyụnwụ mmamiri site na ọwara kwesịrị nke a kpọrọ VVF.

3. Ọ na-ebute ime omume ịnọte aka tupu a mụọ nwa nke n'ụfọdụ oge a waa nwaanyị afọ iji kupụta nwa.

4. Ụfọdụ agaghị ama etu esi eleta nwa ha mụrụ ọhụrụ.

Gee ihe Dọkịta Ezechukwu kwuru n'uju:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionDr Ezechukwu: Ọghọm dị na erughị eru alụ di

Ihe mere ndị mmadụ ji ekenye nwata nwaanyị di n'etorughi etoru?

Mana ndị mmadụ nwere isi okwu kpatara ha ji ekenye maọbụ lụọ nwa ada erubeghi eru.

Lee ụfọdụ n'ime ha:

I. Ụmụnwoke na-achọ nwa ada na-amabeghi nwoke

Na nkọwa ya, otu nwoke a kpọọ Kenneth Eze kwuru na "O nwere ụmụnwoke na-achọ ụzọ n'enweghi onye garala ya."

2. Iji gbalahụ ime ọkwa

Eze gara n'ihu kwuo sị "Nne na nna chọpụta na anya nwa ha nwaanyị dị na nwoke, kama ọ ga-emebi, ha emechie anya n'ihu kenye ya di."

3. Ụbịam na enweghi nghọta

N'okwu ya, Patrick Osuji gwara BBC Igbo na ụfọdụ ụmụnwoke na-alụ ndị dị otu a ji nweta onye ha ga-agbazinwuru.

Akụkọ ga-amasi gị: