World Braille Day: 'Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ'

World Braille Day: 'Abara m n'ọrụ nkuzi maka na ugwu adịghị n'ịrịọ arịrịọ'

Ọtụtụ oge ka a na-ahụ ndị kpuru isi ka ha na-anọ n'akụkụ ụzọ na-arịọ arịrịọ.

Mana nke a abụghị maka Ofojebe Toochukwu, bụ nwoke kpuru isi mana o kweghị ka ọnọdụ ahụ kụtuo mmụọ ya.

Site n'enyemaka ndị ezinụlọ ya, Toochukwu gụrụ Mahadum ma bụrụ onye nkuzi mgbakọ na mwepụ n'ụlọakwụkwọ Urban Girls Secondary School dị n'Ekwulobia, Anambra Steeti.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'afọ 2018, Tochukwu gwara BBC Igbo na ọnọdụ ya dịka onye kpuru isi egbochighi ya ime ihe na-amasị ya bụ ịkuzi ihe.

Toochukwu gara n'ihu kwuo na ya edeela ọtụtụ akwụkwọ ọgụgụ nke a na-eji akụziri ụmụakwụkwọ ihe na Sekọndịrị nke nta n'ụlọakwụkwọ dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ọ gbara ndị nọ n'ụdị ọnọdụ ya ume, ka ha hapụ ịrịọ arịrịọ kama chọọ otu ihe ha ga na-eme iji nyere onwe ha aka.

Braille - Usoro ndị kpuru isi ji agụ akwụkwọ

Ebe foto si, Britannica.com

O nwereike ịgba ọtụtụ mmadụ etu ndị kpuru isi si agụ akwụkwọ ebe ọ bụ na ha anaghị ahụ ụzọ.

E nwere tekịnụzụ a na-akpọ Braille, nke onye kepụtara ya bụ nwoke a na-akpọ Nelso Braille, n'afọ 1824.

Kamgbe ahụ e nweela ọtụtụ mwulite n'usoro 'braille', ma nwekwaa ụdị braille dị icheiche maka ndị nọ na ngalaba mmụta sayensị, 'music' na ndị ọzọ.

Ụbọchị anọ nke ọnwa Jenụwarị afọ ọbụla - nke bụkwa ụbọchị ncheta ọmụmụ Louis Braille - bụ 'World Braille Day'.

World Braille Day - Gịnị ka ọ bụ?

Ọ bụ ụbọchị e wepụtara iji too Louis Braille maka mbọ ọ gbara iwepụta usoro ndị kpuru isi ga-eji na-agụpụta ihe.

Ọ bụkwa ụbọchị e ji enyocha ma nabata usoro ọgbara ọhụrụ dị icheiche e wepụtarala iji wulite mmụta maka ndị kpusu isi.

Ụbọchị a bụkwa ụbọchị e ji echetara ndị ọchịchị mba ụwa nakwa ọha mmadụ mkpa ọ dị inye ndị kpuru isi ezi agụmakwụkwọ.

Kirie ihe ajụjụ ọnụ ya n'uju:

Onye mere akụkọ a: Chris Sanctus Chukwudi Okereke, Chimezie Ucheagbo

Akụkọ ndị ga-amasị gị: