Anambra election 2021: Ihe 5 nwere ike isi ebe a na-atụ vootu kpọga gị mkpọrọ

Onye ndị uweojii na-akpụpụ

Ebe foto si, Getty Images

Ka ị na-akwado ịga ebe ị ga-ebinye aka n'akwụkwọ vootu, ị ma ihe ndị ị na-ekwesịghị ime ma i ruo ebe a na-eme ntuliaka?

Ntụliaka a nwere ike ịbụ nke mbụ ị na-esonye maọbụ ọ bụrụ na i sonyela na ntuliaka ugboro ugboro, mana ị ma ihe ndị nwere ike ibutere gị nsogbu n'ọgbọ ntuliaka?

Dịka otu na-ahụ maka ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) siri kwuo, ime ihe ise a n'ọgbọ ntuliaka ga-ekotere gị okwu na ụka.

Gbanarị ihe ise a:

N'agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-ekwu na ntuliaka ọkwa gọvanọ agaghị enwe isi n'Anambra steeti, Inec na-adọ aka na ntị na ihe ndị ga-ebutere gị nsogbu ma ị mee ha taa.

1) Aghọgbula onye ọbụla na ị bụ onye ụlọọrụ Inec:

Ụfọdụ oge ka ị ga-ahụ ndị na-agwa ndị mmadụ na ha na-arụrụ Inec ọrụ, mana otu abụghị n'ezi.

Marakwa na aka kpara gị ka ị na-aghọgbu ndị mmadụ n'ụzọ a, ị ga-akwụ nha otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ.

2) Iji akwụkwọ mbinyeaka:

E jide gị ka i ji akwụkwọ mbinye aka (ballot paper) nke ị na-enweghị ikike ijide, ị mara na ị nọ n'ezigbo ofe dị ọkụ.

Ọ bụrụ na adaghị gị nha ịkwụ nde naịra iri ise (N50m), ị mara na ị nwere ike ịga mkpọrọ afọ iri.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Iwu Inec achọghị ịma ma ị bụ nwoke maọbụ nwaanyị. Onye dara ya adaala ya.

3) Iji ngwaọgụ bịa:

Ụbọchị ntụliaka, ị kwesịghị iji ngwaọgụ maọbụ ihe nwere ike imerụ mmadụ ahụ bịa.

Ebe foto si, Getty Images

E jide gị ka i ji ngwaọgụ dịka egbe maọbụ mma na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, ị ga-akwụ puku narị naira ise (N500k) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ maọbụ ha abụọ.

4) Inye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntliaka gị:

Ị daala iwu ma ị nye onye ọzọ akwụkwọ ikike ntuliaka gị nke a na-akpọ "PVC" ka o were mee ntuliaka.

Ị dakwara iwu ma ọ bụrụ na i jide PVC karịrị otu (nke bụ nke gị). E jide gị, ị ga-akwụ iwu otu nde naịra (N1m) maọbụ ị gaa mkpọrọ otu afọ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Ebe a na-eme ntuliaka nke Bekee kpọrọ "polling booth'

N'otu aka ahụ, ị ga-akwụ iwu otu puku narị naịra (N100k) maọbụ ị gaa mkpọrọ ọnwa isii maọbụ ha abụọ ma e jide gị ebe i ji akwụkwọ ikike ntuliaka onye ọzọ jirila mee ntuliaka.

5) Iburu ngwaọrụ e ji eme ntliaka:

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Naanị ndị na-arụrụ Inec ọrụ nwere ikike ịmetụ ngwa e ji eme ntuliaka aka

E jide gị ebe ị maburula ngwa ọrụ e kwesịrị iji eme ntuliaka, ị dabanyela n'ezigbo nsogbu.

Ị ga-aga mkpọrọ afọ abụọ.

Ụlọọrụ Inec ji nke a dọọ ndị mmadụ aka na ntị na websaịt ha.